ANYỊ KA NA ENWE MMEKỌAHỤ N’AGBANYEGHỊ NA ANYỊ BỤZI AGADI- JOKE SILVA

Spread the love

Legọs – Joke Silva, ochie dike na imebe ejije Nọlywud ekwuola na ya na ezigbo di ya, Olu Jekọbs ka na-enwekwa mmekọahụ n’agbanyeghị na ha bụzi agadi.

Joke Silva na di ya, Olu Jekọbs, mmadụ abụọ na-ewu ewu na Nọlywud gbara akwụkwọ n’afọ 1989 ma mụtakwa ọmalincha ụmụaka olemole.

N’okwu ya n’ajụjụ ọnụ a gbara ya na Continental TV, Joke kwuru na ya na di ya ka na enwekwa mmekọahụ.

“Ee, anyị ka na enwe mmekọahụ, mana n’ụzọ kwesịrị ndị ọgbọ anyị”

Silva, kọwakwara na afọ ole mmadụ dị anaghị egbochi inwe ezi ịhụnanya n’etiti di na nwunye ma ọ bụkwanụ ụmụ nwoke ịchụ nwanyị nọ na di.

“Mgbe m nọ mahadum dịka nwanyị ji ụmụ abụọ, o gbochighi Ọkammụta anyị ịchụwa m”

Hmm, ihe bụ nnukwu nkuzi nyere di na nwunye ndị chere na ha ga akwụsị igosipụta ịhụnanya ha site na maka na ha bụzi agadi

Leave a Reply

Your email address will not be published.