YENAGOA:ONYE UWE OJII AGBAGBUOLA ONYE KỌPA

Spread the love

Yenagoa – Ebelebe gburu oge onye uwe ojii nọ nche n’ụlọ akụ dị n’Ekeki, Yenagoa bụ isi obodo Bayelsa Steeti gbagburu otu nwatakịrị nwoke onye kọpa ma merụkwaa otu onye ọkwọ ụgbọala ezigbo ahụ.

Nsogbu dapụtara oge ụgbọala Peace Mass Transit si Abakaliki kwụsịrị ndị njem n’ihu ụlọ akụ ahụ.

Nkea buteziri nghọtahie n’etiti onye Uwe Ojii ahụ bụ onye ‘Mopol’ na onye ọkwọ ụgbọala ahụ.

Ka egwu ka egwu, onye uwe ojii ahụ gbaziri onye ọkwọ ụgbọala ahụ ọnụ egbe abụọ. Otu tụtara onye kọpa ahụ, onye kubiri tupu e ruo ụlọ ọgwụ.

Kaọdịtaa, a nọzị n’ụlọ ọgwụ Federal Medical Centre (FMC), Yenogoa were na-azọzi ndụ onye ọkwọ ụgbọala ahụ.

http://www.hoohaa.com.ng/2019/10/01/asabaonye-uwe-ojii-agbagbuola-nwanyi-onye-otu-ya/

Ndị gbakọrọ ebe ahụ jizi iwe were malite imebi ihe ndị ụlọ akụ ahụ.

A kpụrụla ya bụ Onye Uwe Ojii kpọchie site na ntuzi aka Kọmishọna ndị Uwe Ojii na steeti ahụ bụ CP Uche Anozia, ruo na e mechaa nnyocha maka okwu ahụ.

Hmm, nsogbu akarịa n’obodo. Nkea, ọ bụ ihe mmadụ ga-eji malite afọ ọhụrụ? Chaị

Leave a Reply

Your email address will not be published.