AGỤỤ AJỌKA! A KPỤPỤWO NWOKE ZURU MMANYA E JI EKWU MASS NA NCHÀ ỤLỌIKPE

Spread the love

Legọs – Faniyi Ajibola, 27, ka a kpụpụrụ ụlọikpe Majie na Legọs ụbọchị Fraịdee maka izu ekpem mmanya eji ekwu mass abụọ, ncha na nnu pụtara N46,000 n’ụlọ ụka. 

Ajibola, onye bi na Mushin, Legọs, gwara ụlọikpe na ikpe amaghị ya.

Insp. Edet Akadu, gwara ụlọikpe ahụ na Ajibola dara iwu ahụ n’abalị iri abụọ n’anoynke ọnwa Septemba, afọ 2019.

“Ndị ụka Katọliki ahụ dị na Mushin jidere ha ka ọ nọ n’ebe nchụàjà na aṅụ mmanya e ji aka mass wee gbụgara ya ndi Uwe Ojii

Ichie Majie K.O. Ogundare nyere nwamadị ahụ mgbapụta ụlọikpe n’ọnụ N20, 000 ma ọ bụ mmadụ abụọ ga-eji ego ruru ole ahụ. 

E higharịzị ikpe ahụ ka ọ dịwa n’abalị ise  nke ọnwa Febrụwarị.

Chaị! Agụụ ajọka. Mana, ndị ụka ahụ emetaghi ya chaa chaa. Nwoke agụụ ji, ha kwesịrị inye ya nri ka o rie ma dọọ ya aka ná ntị maka ịwakpo ụlọ ụka ọzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.