AMOTEKUN :NDỊ GỌVANỌ MGBAGO UGWU GA EBIDOKWA NKE HA – LALONG

Abụja –  Aka na-achị Plaatu Steeti ma bụrụkwa Onyeisi Oche Otu ndị Gọvanọ Mgbago Ugwu ekwuola na steeti iri n’itolu nọ na Mgbago Ugwu agamiela maka atụmatụ ịmalite Uwe Ojii ógbè na mpaghara ahụ.

Lalong kwuru nkea ụnyahụ oge ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu n’Obi Gọọmenti Etiti bụ Asọ Rọk, Abuja, ka ọ bịara kpọtụrụ Onyeisiala, Ọchịagha  Muhammadu Buhari (laworo ezumike).

N’okwu banyere otu nchekwa ọhụrụ ndị Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda, a kpọrọ ‘Amotekun’, Lalong kwuru na ndị Ugwu Awụsa agamiela na ịmalite atụmatụ Uwe Ojii ógbè nke ha.

“Ị na-ekwu maka mpaghara Etiti Mgbago Ugwu, a bụ m Onyeisi Oche, Otu ndị Gọvanọ Mgbago Ugwu; afọ gara aga, anyị kpebiri maka nkea, a hụrụ m Onyeisiala were gwa ya ihe anyị na-eme.

Ọ kọwara na ha hiwere otu nhazi (Kọmitii) dị iche iche maka nkea.

” Ọnọdụ dị na Mpaghara Ndịda agaghị abụcha otu ọ dị n’ugwu, anyị na atule ụzọ esi eleba anya na okwu ndị dịgasịrị anyị n’ebe a”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.