ỌNWỤ INSTAGRAM: NWA AGBỌGHỌ GBURU ONWE YA MAKA NA ỌTỤTỤ MMADỤ EBINYEGHIRI YA AKA MMASỊ NA INSTAGRAM

Nwa agbọghọ dị afọ iri n’itolu, onye oba ozi mmekọrịta na-agba ara, gburu onwe ya abalị ise tupu ụbọchị ekeresimesi maka na ndị binyere ya aka mmasị (likes) na Instagram ebughi ibu etu ọ chọrọ.

Chloe Davison ka a hụrụ ozu ya n’ụlọ ndị be ha dị na Lanchester, County Durham, n’abalị iri abụọ nke ọnwa Disemba.

Nwa agbọghọ ahụ bụ onye nlereanya ekike (model) ka na-ebido ebido, ji Ọbaozi mmekọrịta eme onwe ya obi ụtọ.

Nwanne ya nwanyị, Jade, kọwara na Chloe na-ahụta onwe ya dịka onye abaghị uru ma ọ bụrụ na o nwetaghị ọtụtụ mmasị nakwa okwu dị mma n’aka ndị mmadụ.

“Chloe nọ na-ebe ákwá ọtụtụ abalị maka na mmadụ kwujọrọ ya n’ọbaozi”

Dịka nwanne ya nwanyị siri kọwaa, onye a laworo mmụọ nwere puku pụrụ puku ndị nsonaazụ n’ọbaozi mkparịta ụka, ndị na-akọcha ya ọtụtụ oge na ọ maghị mma

Ọ kwụgburu onwe ya n’ime mkpùrù(ụlọ ndina) ya ka ọ gachara n’ọba ozi.

http://www.hoohaa.com.ng/2020/01/05/pot-haakot-agbamakwukwo-facebook/

Nne ya, Clair Reynolds, 44, sịrị na ezinụlọ ha agaghịzịkwa ekeresimesi, na ya echeghi na ha ga agbazịkwa ya ọzọ n’ụwa a.

N’anya mmiri, ọ gwara ndị nta akụkọ: “Chloe mara mma mana ọ hụtaghị ya. Sọọsọ ihe dị ya mkpa bụ etu ndị mmadụ si ahụta ya.

” Ọbaozi mkparịta ụka tara isi ya. Etu o si emetụta ndị ntorobịa dị oke njọ. Ọbaozi mkparịta ụka weghaara ndụ Chloe- ma ọ bụ Snapchat, ma ọ bụ Facebook.

Hmm, “gbara gbara fere ókè, ọ bụrụ ara” maka na “ihe na aka mma n’ókè abụọ”. Gị, onye bi ebi n’ọba ozi, onye ji ịgwa ndị ọzọ okwu ọjọọ mere aka ọrụ.

Uche gị dịkwa ya tupu mmadụ a kwụọrọ gị ụdọ.

Mana ihe ụwa bụkwa “ndị n’ọchị, ndị n’ákwà”  “ọsọ ndị, owendi” . Ụfọdụ na-esi n’ọbaozi mkparịta ụka lụọ di na nwunye, ụfọdụ e si ya kwụọ ụdọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.