ALA ỌMA JIJIJI, N’ABỤJA?

Spread the love

Abụja – Ụlọ ọrụ Naịjiriya na-ahụ maka ihu ígwé bụ Nigeria Geological Survey Agency nọrọ ụnyahụ gwa ọhaneze ka ha ghara ịnya ntị n’akụkọ ahụ na-efegharị banyere ala ime ụṅara (earth tremor) n’akụkụ ọbụla n’Abụja, ma ya fọdụzịa ala ọma jijiji. 

Dọkịnta Abdulrazaq Garba, Onye Nlekọta Ukwu ụlọ ọrụ ahụ, n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyahụ n’Abụja kwuru na onye wepụtara nchọpụta ahụ kwesịrị ịbịa ka ya na ndị ụlọ ọrụ ahụ lebaa okwu ahụ anya.

“Kaọdịtaa, site na nnyocha nakwa akara ngwa anyị nile, o nweghị ihe dịka ala ime ụṅara n’akụkụ ọbụla n’Abụja.

“Onye dere ihe ahụ sịrị na ya bụ ala ọma jijiji mere n’akụkụ Abaji na Gwagwalada mana ụlọ ọrụ anyị enwetaghị ozi ọbụla banyere ya”

Garba kwukwara na Onyeisi ngalaba ụlọ ọrụ ha na Mahadum Abụja, Gwagwalada sịkwa na o nweghị ozi ọbụla banyere udiri ihe ahụ.

Kaosiladi, ndị  mmadụ ka chetara na enwebuola ala ime ụṅara n’akụkụ Mpape na Maitama dị n’Abụja n’abalị ise ya n’abalị isii nke ọnwa Septemba afọ 2018.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.