NWUNYE ỤKỌCHUKWU ADAALA NWA BE YA ‘IRON’ DỊ ỌKỤ MAKA INYỤ MAMỊRỊ N’ÁKWÀ

Spread the love

Legọs – Ndi Uwe Ojii ejidela otu nwunye Ụkọchukwu, Oriakụ Olusọla Adeleke n’Iko-Ọba, Legọs maka ịda nwa be ya ‘iron’ e ji ede ákwà.

A kpụụrụ ya na Ụkọchukwu dị ya, Adebanjọ maka etu ha si arụsa nwatakịrị nwanyị, dị afọ itolu ha na ya bi kemgbe afọ abụọ.

Ajọ ụkọchukwu a na nwunye ya rapụtara onwe ya na nso a, oge ha jụrụ ịkpọga nwatakịrị ahụ ụlọ ọgwụ ka nkịta ha tara ya.

Nkea meziri ka Ọrịakụ Toyin Taiwo-Ọjọọ, onye ọkaiwu na-ahụ maka ikike dịịrị ụmụaka were bata n’okwu ahụ.

Taiwo-Ojo, kwuru na apa juru ya n’ahụ, ma nke igwè ide ákwà (iron), nke arụ nkịta nakwa ụtarị.

Taiwo-Ojo sịrị na :”Ụkọchukwu ahụ sịrị na nwunye ya ji ya bụ igwè ide ákwà na egwusa nwatakịrị ahụ egwu. Oge m jụrụ ya ma ‘iron’ a bụ ihe e ji egwu egwu, o mechie ọnụ”

Kaosiladi, nwatakịrị ahụ sị na a dara ya ‘iron’ dị ọkụ maka na ya nyụrụ mamịrị n’elu ákwà.

Nna ya anọghịkwa ndụ, ọ maghịkwa aha nna ya mana ọ ma na ọ bụ onye Agbara, Badagrị.

Ọ sịkwa na ụkọchukwu ahụ na nwunye na-apịa ya koboko.

Hmm, ihe Chukwu ga-ekpe karịkwara. Ụkọchukwu!

Leave a Reply

Your email address will not be published.