OMIRHOBO AGBAALA GỌỌMENTI ETITI AKWỤKWỌ MAKA IJI ASỤSỤ ARAB DEE IHE NA NAỊRA

Abụja – Onye ọka iwu ama ama maka ikike dịịrị mmadụ, Ichie Malcolm Omirhobo agbaala Gọọmenti Etiti akwụkwọ n’Ụlọikpe n’Abụja ka ụlọikpe ahụ nye nkọwa banyere nkeji iri (section 10) nke iwuala Naịjiriya, ka o si metụta ihe e dere n’asụsụ Ndị Arab n’ego Naịjiriya bụ Naira nakwa n’ejirimara ndị Agha Naịjiriya. 

Ndị aghara akwụkwọ ahụ bụ Ụlọ akụ Etiti Naịjiriya, Ọka iwu Ukwu Naịjiriya, Ndị Agha Naịjiriya nakwa Mịnịstrị na-ahụ maka nchekwa.

Onye a ghara akwụkwọ chọrọ ka ụlọikpe kọwaa ma o ziri ezi iji asụsụ Arab dee ihe na Naira nakwa n’ejirimara ndị Agha Naịjiriya, ebe Naịjiriya bụ obodo n’enweghị okpukperechi ọ họọrọ iche.

Ọ kọwara na asụsụ ọrụ ala Naịjiriya bụ Bekee tinyere Igbo, Awụsa na Yoroba, ma ọ dị na mkpa.

Ọ chọrọ ka ụlọikpe kpebie na o megidere iwu, bụrụ ihe n’ezighi ihe bụ Ndị Agha Naịjiriya iji asụsụ ndị Arab were dee ihe n’ejirimara ha.

Omirhobo chọzịrị ka ụlọikpe ahụ nye iwu ka Ndị Agha Naịjiriya nakwa Ụlọ akụ Etiti Naịjiriya wepụ ihe ndị ahụ e dere na Naira nakwa nke e dere n’ejirimara Ndị Agha Naịjiriya n’asụsụ Ndị Arab, ma degharịa ha na bekee bụ asụsụ ọrụ ala anyị, ma ọ bụkwanụ e degharịa ha n’asụsụ Igbo, Awụsa a Yoroba.

E tinyebeghi ụbọchị a ga- anụrụ ikpe ahụ.

Hmm, onye hụrụ odogwu a bụ Omirhobo kelee ya maka na “a gbaghị ụzọ azụ owere mgba, ọ gaghị echi”

Leave a Reply

Your email address will not be published.