GỌỌMENTI AKWỤSỊLA NGOSIPỤTA EJIJE BANKY W KATỌRỌ EFCC

Legọs – Ụlọ ọrụ  National Film and Video Censors Board(NVFCB) etiela iwu ka ụlọ onyonyoo nile nọ na Naịjiriya kwụsị igosi ejije Banky W mebere a na-akpọ ‘Sugar Ray’.

Onye Nlekọta NVFCB, Adedayo Thomas, gwara ndị nta akụkọ na ihe e jiri kwụsị ejije ahụ abụghị maka na ọ na-egosi ndị EFCC ka ndị amaghị ọrụ ha.

Ejije ahụ, ‘Sugar Ray’ adatawo akatamkpo ego dị Narị Nde n’iri isii kemgbe ọ pụtara n’ụbọchị ekeresimesi afọ 2019.

Onye oti egwu Bankole Wellington (Banky W) na nwunye ya bụ ndị mere ya bụ ejije ji akpọtụ akpọtụ.

‘Sugar Rush’ na-akọ maka ụmụ nwanne nwanyị atọ ndị hụrụ $800,000 na ntụmadi n’ụlọ otu nwoke riri ego ọha na ngari.

Ejije ahụ gosiri etu mbọ ndị EFCC gbara inweta ego ahụ siri kpụọ afọ n’ala, nke na-egosi ndị ụlọ ọrụ EFCC dịka ndị n’amaghị ọrụ ma na ebijogharịkwa aka.

Ọtụtụ mmadụ hụtara na ọ bụ maka etu ejiji ahụ siri wụọ ndị EFCC n’ala mere e ji weghachi ikike ngosipụta e nyeburu maka ya.

N’ozi o zipụrụ na Twitter, Banky W  kwuru sị, “E kelee m unu nile maka nkwado ejije anyị bụ ‘Sugar Rush’ nwetara. Kaosiladi, a kwụsịla ngosipụta ya n’ụlọ onyonyoo maka okwu ụfọdụ n’adịghị anyị n’aka.

” Anyị nwere olileanya na-aga edozi okwu ahụ n’oge adịghị anya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.