OWERE: ONYE OHI ESIWO N’ỤLỌ ELU MATUO, NWỤỌ

Spread the love

Owere – Onye ohi,  Uche Akụnacha, 41, anwụọla ka o si n’ụlọ elu nkwago abụọ matuo ka a na-achụ ya ọsọ na Mgbidi, Imo Steeti. 

Ọnụ na-ekwuru ndị Uwe Ojii n’Imo Steeti, Orlando Ikeokwu, kwuru na Akụnacha si n’ụlọ otu nwoke, Tochukwu Okafọ matuo were zute ọnwụ ya.

Ikeokwu kọwara na Okafọ tikuru ndị mmadụ ma chọọ ijide onye ohi tupu ọ mịchapụ were matuo.

Onye ohi ahụ pịara isi n’ala ma nwụzịa n’ụlọ ọgwụ.

Ikeokwu kwuru sị, “Otu nwoke, Tochukwu Okafọ nke bi na College Road, Mgbidi, nyere mkpesa na ya batara, hụ na e tiwaala igodo ụlọ ya.

“Ka ọ banyere, ọ hụrụ nwoke ji ‘spanner’ n’ime ụlọ ya na-akwasasị ụlọ ya, o were nọchie ya ụzọ were tiwe mkpu.

” Onye ohi ahụ mịchapụrụ were si ebe ahụ matuo, pịa isi n’ala.

O kwukwara na onye ohi nọ n’ụlọ ọgwụ were saa asịsa, nwunye ya bịakwa leta ya tupu ọ nwụọ.

Hmm,” ụwa onye ohi adịghị mma”. Leenu ka nwoke a siri menye nwunye ya ihere ma lakwaa ndụ ya n’iyi. Tụfịakwa!

Leave a Reply

Your email address will not be published.