FADA ỊLỤ NWANYỊ: POOPU FRANSIS NA POOPU BENEDIKTI AKWỤGHỊ

Spread the love

Vatikan –  Poopu Benedikti XVI rịtuworo n’ọkwa akatọọla atụmatụ nke Poopu Fransis chọọ ịhapụ ndị lụrụ nwanyị ka ha chie ụkọchukwu.

Benedikti onye kọwaburu ka ọ na-arịtu n’ọkwa n’afọ 2013, na ya agaghị na etinye ọnụ n’okwu banyere ọrụ onye nọchiri ya, nọ n’akwụkwọ kpụ ọkụ n’ọnụ nke ya na Kadịnal Rọbọọt Sera dere kwuo na atụmatụ ndị ‘fada’ alụghị nwanyị kwesịrị ịdịgide.

Okwu a dịka igbochi atụmatụ Poopu Fransis bu n’obi ịhapụ ndị lụrụ nwanyị ka ha chie ụkọchukwu na Mpaghara Amazon, Brazịlị.

Akwụkwọ ahụ kpọkuru ndị Katọliki ka ha ghara ikwe ka “ịrịọ biko aghụghọ, ime ka ewee sị, okwu asị ekwensi wepụtara nakwa ime ihe ụwa chọrọ butuo iwu ụkọchukwu izeere nwanyị”

Poopu Fransis kwetara n’Ọktoba, afọ 2019 ilebanye anya n’arịrịọ ndị Bishọọpụ si Amazon ịhapụ ụmụ nwoke lụrụ nwanyị ka ha chie ụkọchukwu n’akụkụ ime obodo, ebe e nwere ụkọ ndị ụkọchukwu.

“A gaghị m agba nkịtị” Benedikti, 92, kwukwara n’akwụkwọ ahụ.

Ọtụtụ ndị ụkọchukwu na ndị ụka Katọliki na ahụta Poopu Fransis dịka onye chọrọ iweta mgbanye ga-emebi usoro ofufe nru ndị ụka ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.