ONYEISI OKPURU ỌCHỊCHỊ NSỤKA JI ỊKWA ‘BARROW’ AKWALITE NDỤ NDỊ NTOROBỊA

Spread the love

Comrade Maakị Ọnụọha- Nkea adabaghị, Hon Chinwe Ugwu, ị ga-ebunye ụmụ gị ‘barrow’? 

Nsụka – Onyeisi Oche Okpuru Ọchịchị Nsụka, Hon. Chinwe Ugwu, nọrọ ụnyahụ na Nsụka were mee mmemme ịkwalite ndụ ndị ntorobịa ebe o bunyere ha ‘barrow’ ọhụrụ iri atọ iji nyere ndụ ha aka.

Ugwu kọwara na nke bụ iji nyere ha aka ha ha ghara ịna aga na anata ‘barrow’ ha ji arụ ọrụ n’aka ndị mbunye ‘barrow’ kwa ụbọchị.

Kaosiladi, Ọnụ na-ekwuru Ọgbakọ Ndị Ntorobịa Enugwu Steeti, Comrade Maakị Ọnụọha gbarụrụ ihu n’udịrị atụmatụ ịkwalite ndụ ndị ntorobịa nke ahụ nke ọ kọwara dịka “ịbụ ndị ntorobịa Enugwu asọ (mmiri) n’ihu.”

“Nkea bụ ịbụ ndị ntorobịa Enugwu Steeti asọ (mmiri) n’ihu ma bụrụkwa nnukwu mkparị nye ọchịchị Ugwuanyi!”

Ọnụọha kwukwara na “Ọchịchị Ugwuanyi, ọ kacha Okpuru Ọchịchị Nsụka kwesịrị ndi ntorobịa Enugwu Steeti, ọ kacha ndị nke Okpuru Ọchịchị Nsụka mgbaghara ozigbo.

“Nsụka nke  m maara, nwere ndị ntorobịa nwere ọgụgụ isi,  gụrụ akwụkwọ ma na agbakwa mbọ. Ọ bugoduru na ndị ị chọrọ inyere aka bụ ndị ntorobịa n’agaghi akwụkwọ, #MadamMayor, e nwere atụmatụ ndị ọzọ maka ịkwalite ndụ kara ịka mma karịa arụrụala ị rụsara ụmụ ndị ọzọ.

“Ị ga-ebunye ụmụ nke gị ‘wheelbarrow’ iji kwalite ndụ ha? Nkea adabaghị, Hon. Chinwe Ugwu”

Hmm, Hon. Chinwe Ugwu bụkwa odebe atụ (history maker) site na ịbụ onye mbụ n’Ala-Igbo ji ‘wheel barrow’ e mere ndị ntorobịa ọgọ, dịka atụmatụ ịkwalite ndụ ha.

Ebe a na anụ udiri akụkọ bụ na Benuwe Steeti, ebe Gọvanọ Sam Ortom bụ ‘oji barrow eme ọgọ’. Kedu ka o si hapụ iṅomi Gọvanọ Steeti ya bụ Ifeanyị Ugwuanyi, onye na-agba mbọ imeta ndị ntorobịa ọfụma?

Hmm, nwanyị a kakwara obi.

Leave a Reply

Your email address will not be published.