ỤGBỌALA BU MMANỤ NA-AGBA ỌKỤ, ONYE UWE OJII NỌRỌ NA-ESE FOTO

Spread the love

Ọka – Ụgbọala mmanụ dabanyere taa n’ogige ndozi ụgbọala dị n’ụzọ awara Enugwu-Ọnịcha n’ebe nsicha (bypass) di n’Amaọbịa, Ọka were gbarie ma nwuru ọkụ.

Ndị ọrụ ntinyụ ọkụ na ndi ọrụ nchekwa ndị ọzọ so na enye aka itinyụ ọkụ ahụ nakwa ịhụ na ndị na-agba n’okporo ụzọ ahụ zeere ọkụ ahụ ma si ụzọ ọzọ.

Ọ bụladị Kọmishọna nsị Uwe Ojii na steeti ahụ, Jọn Abang gbarutere were anya ya hụ etu e si etinyụ ọkụ ahụ.

Ihe gwụzịrị ndị mmadụ ike  bụ na otu onye Uwe Ojii hapụrụ ihe ibe ya na-eme were ekwentị ya na-ese ọkụ ahụ  onyonyoo.

Hmm, nkea bụ mmadụ ejighi ọrụ ya kpọrọ ihe. Kọmishọna ndị Uwe Ojii na steeti ahụ kwesịrị ịchọpụta Onye Uwe ahụ kpara agwa ka onye obi tara mmiri nwetara ntaramahụhụ ziri ezi.

Leave a Reply

Your email address will not be published.