AMOTEKUN: MALAMI BỤ ONYE NKỌGHERI-SAGAY

Spread the love

Legọs – Ọkammụta Itse Sagay (SAN), Onyeisi Oche, Kọmitii ndụmọdụ Onyeisiala megide ngarị  bụ Presidential Advisory Committee Against Corruption (PACAC) agwala ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ka ha gbachite Ọkaiwu Ukwu na  Mịnịsta maka Ikpenkwụmọtọ ala anyị, Abubakar Malami (SAN) na okwu ya na otu nchekwa ndị Yoroba bụ Amotekun megidere iwu bụ okwu nkọgheri. 

Mazị Abubakar Malami nọrọ n’ozi ya ụbọchị Tuuzdee, kwuo na nchekwa bụ ọrụ dịịrị sọọsọ Gọọmenti Etiti.

“Nhiwe otu nchekwa Amotekun megidere iwuala Naịjiriya” Malami kwuru n’ozi ọnụ na-ekwuru ya, Umar Gwandu wepụtara n’aha ya.

“N’ihi ya, enweghị Gọọmenti Steeti ọbụla, ma ọ bụ iche iche ma ọ bụ na njikọta ọnụ, nwere ikike ihiwe otu ọbụla maka nchekwa Naịjiriya ma ọ bụ akụkụ ya ọbụla.

Kaosiladi, n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, Sagay kwuru na o nweghị ihe ọbụla kpatara ndị Gọvanọ ga-eji gaa hụ Malami tupu ha amapụta atụmatụ iji chekwaa Steeti ma ọ bụ mpaghara ha.

Hmm, kedụzi maka Gọvanọ Saịmọn Lalong nke Plaatu Steeti ma bụrụkwa Onyeisi Oche ndị Gọvanọ Ugwu Awụsa, onye kwuru na ndị Gọvanọ mpaghara ha na-akwadokwa ịmalite atụmatụ nchekwa nke ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.