LEENU SIR WILI OBIANỌ, “PAPAL KNIGHT”

Spread the love

Vatikan – Poopu Fransis nọ na Vatikan taa were  chie Gọvanọ Wili Madụabụrọchukwu Ọbianọ echichi dịka Oke Nze ụka Katọliki (Papal Knight) .

Ihe a bụ nnukwu echichi a na-echi ndị gbara mbọ pụrụ iche iji kwalite nzukọ nsọ Katọliki n’ọrụ igbasa oziọma Kristi.

hoo!haa!! na-ekele  Akpọkuedike maka nnukwu ugwu a  kwanyere ya na Vatikan bụ isi ọchịchị nzukọ nsọ Katọliki.

Kaosiladi, ụfọdụ ndị osu imi na-atamu, na-ajụ  ihe mere Poopu Fransis ga-eji echi ya echichi ahụ, na e jighị ụka mara ya.

Ụfọdụ ka buuru ya iwe n’obi maka etu nwunye ya Osodieme Ebele Obianọ si buru ọgọ gaa Ala Bekee, gaa ịgbara ndị Amerịka Ekeresimesi.

Hmm, Bikonu, Poopu ka ọ dịịrị ịma ndị ọ ga-echi echichi

Leave a Reply

Your email address will not be published.