OSINBAJO GBAARA IHEDỊỌHA AMA NKATA A KPAARA YA

Spread the love

Owere – Na ọchịchị Rt. Hon. Emeka Ihedioha dika Gọvanọ Imo Steeti abịawo na njedebe ka ọ nọchara sọọsọ ọnwa asaa abụghịzị akụkọ.

Nke na-eme ugbua bụ na Osote Onyeisiala, Ọkammụta Yemi Osinbajo gbaara Rt. Hon. Emeka Ihedioha ama banyere nkata a na-akpa maka ibupu ya n’ọkwa ọchịchị.

Onye Nlekọta na-ahụ maka Mgbasa Ozi n’ọchịchị Gudlọk Jọnatan, Mazị Jaksịn Ude bụ onye kwupụtara nkea.

Site n’ozi o wepụtara n’amaozi Twitter ya, O kwuru na Ọkammụta Yemi Osinbajo gbaara Emeka Ihedioha oge ikpeazụ ọ bịara Imo Steeti. Kaosiladi, tupu Ihedioha ji aga Abụja ịga hụ ndị ọ gwara ya bụ, ọ bụrụ na “ihe emebiela”

Ihe ọzọ  bụ akụkọ ugbua bụ ma ikpe ahụ e ziri ezi. Ụfọdụ na-ekwu na Ụlọikpe Mkpedebe ekwesịghịkwa ịbụ ụlọikpe ikpeazụ, ma ọ bụrụ udiri a. Na ihe ha kwuru taa n’ikpe kpọrọ Okeke abụghị ihe ha ga-ekwu.

Nsogbu dị!

Leave a Reply

Your email address will not be published.