AMOTEKUN:IPOB GA-EDUNYE NDỊ YOROBA NDỊ NCHE OTU NDE-KANỤ

Spread the love

Onye ndu, otu IPOB, Mazị Nnamdị Kehinde Kanụ ekwuola hoo!haa!! na ndị IPOB ga-enye ndị Yoroba nkwado zuru oke maka otu nchekwa Amotekun ha hiwere site na idunye ha ndi nche otu nde.

Kanụ kwuru nkea ụnyahụ n’ozi ya na Rediyo ‘Voice of Biafra International’.

“A ga m akwado ọgbọ ndị Yoroba nkea ndị hiwere Amotekun. Ha na IPOB ga arụkọ ọrụ. Ha chọọ ndị nche otu nde, a ga m enye ha ya iji hụ na a kwụsịrị ndị Fulani. Anyị ga-akwado ndị Yoroba n’ụzọ ọbụla dị mkpa. Ara gbachie ndị Fulani ntị.

Ọ gakwara n’ihu kwuo sị:

“IPOB kwụ ndị nchekwa Amotekun n’azụ chịm chịm. Amotekun anaghị apụ aga ebe ọbụla. Ha abịala iwere ọnọdụ, IPOB ga-àkwàdo ha”

Aare ọna Kakanfọ Gani Adams nọrọ nwanne ụnyahụ gwa Ọkaiwu Ukwu ala anyị, Abụbaka Malami na ọ maghị ihe ọ na-ekwu site na ịsị na atụmatụ nchekwa Amotekun megidere iwu ebe atụmatụ nchekwa sharịya bụ Hisbah ziri ezi.

Adams bụkwa onyeisi ndị OPC bụ ọchịagha ndị Amotekun.

Hmm, ugo eberela na mgbagbu, ebe ndị IPOB na ndị IPOB jikọnwuo aka ọnụ mara na mmiri ga-afakwa ndị “ahụ” n’ézé.

Ọchịagha Asarị Dokubo sonyekwuoro ha, ihe nile emezia. Haa! Ọ kwa n’obodo a?

Leave a Reply

Your email address will not be published.