IHEDIOHA: PDP KA GA – EME NGAGHARỊ IWE ECHI N’ABỤJA

Spread the love

Abụja – N’agbanyeghị mmachi ndị Uwe Ojii, ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP, ngalaba Imo Steeti ekwuola hoo!haa!! na ha ka ga-eme ngagharị iwe echi n’Abuja megide mkpebi Ụlọikpe Mkpede Naịjiriya nke e jiri chụpụ Emeka Ihedioha were tinye Hope Ụzọdịmma n’ọkwa dịka Gọvanọ Imo Steeti. 

Ndi Uwe Ojii dịbu na mbụ gwa ndị PDP na ha e nyeghị ha ikike ime ya bụ ngagharị iwe. Kaosiladi, ndi PDP, ngalaba Imo Steeti na – eme ka ndi Uwe Ojii mata na ị gaghị eti  nwata ihe sị ya ebela akwa.

Ha kwukwara na ime ngagharị megide ya bụ mkpebi ụlọikpe bụ ikike dịịrị ha dịka ụmụaka n’usoro ọchịchị ọhakarasị.

Ebe a ga-emekwa ngagharị iwe ahụ bụ n’ime ogige isi ụlọ ọrụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ na Legacy House nọ na Maitama, Abuja.

Nkea bụ iji gbalahụ ha na ndị Uwe Ojii inwe nghọtahie ọbụla nwere ike ibute ọgbaghara.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published.