2023 : NDỊ UGWU GA-AHAPỤ NDỊ NDỊDA NDỊDA KA HA CHỊZUO AFỌ ANỌ FỌRỌ HA MA Ọ BỤ…

Spread the love

Abụja – Otu South-South Elders Forum, bụ otu ndị okenye si mpaghara Ndịda Ndịda (South South) Naịjiriya ekwuola na ndị Ugwu kwesịrị ịhapụ ha ka ha chịzuo afọ anọ ha fọrọ afọ maka na Ndị Ugwu ịnọgide n’ọkwa n’afọ 2023 ga-ebute ntisa obodo Naịjiriya.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’Abuja  na ngwụcha izu ụka gara aga, Onyeze Anabs Sara Igbe, Onye Nlekọta Ukwu otu South-South Elders Forum, kwuru na mpaghara Ndịda Ndịda ka nwee ohere inweta ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023 karịa mpaghara ndị ọzọ.

N’uche ya, ndị Ugwu agaghị achọ ikwado ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda maka na obi ka dị Ndigbo ilu maka ogbugbu e gburu nde pụrụ nde n’ime ha n’agha Bịafra tinyere mkpagbu a ka na-akpagbu ha. Nke ọzọ bụ na ndi mpaghara ahụ na-achọkwa Biafra.

Ọ sịkwa na ndị Ugwu agaghị achọ ikwado ndị mpaghara Ọdịda Anyanwụ  Ndịda maka okwu Amotekun ha hiwere.

Sara Igbe, onye bụkwa Odeakwụkwọ Mgbasa Ozi otu Pan Niger Delta Forum, PANDEF, kwuru na ọ bụ mpaghara Ndịda Ndịda bụ ntọala ji Naịjiriya, na ha ga-emekwa ka obi ruo ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ala.

Hmm, Leenụ ndị ọsọ-chi – egbu, ndị ndị Ugwu chọrọ iji tisaa ezi mmekọrịta na-aga n’ihu n’etiti ndị Ndịda na ndị Obinetiti.

Leave a Reply

Your email address will not be published.