ỊNỌ N’ỤLỌIKPE AZA EKWENTỊ: ATỤỌLA OTU NWOKE NGA

Spread the love

Ịlọrịn –  Ọkaikpe Sikiru Oyinloye nke ụlọikpe Kwara Steeti, Ilorin atụọla otu nwoke, Abdulwahab Adebayo, nga izu ụka abụọ maka ịnọ n’Ụlọikpe were na-aza ekwentị ka ikpe na-aga n’ihu. 

Abdulwahab bịara maka ikpe o nwere were jiri ekwentị ọ na-aza na-enye ụlọikpe ahụ nsogbu. Ọkaiwu ahụ kwuru na oge onye Uwe Ojii nọ ọrụ n’Ụlọikpe ahụ gwara ya okwu na o leghara ya anya ma kpọọ ekwo nkụ.

Ọkaikpe Sikiru Oyinloye mazịrị Adebayo ikpe maka iji ekwentị were na-enwe ụlọikpe ahụ nsogbu.

“Onye a a maworo ikpe jụrụ ịkwụsị inye ụlọikpe a nsogbu wee ruo na onye Uwe Ojii ejiri ike kpụpụ ya ezi. Agwa ọ kpara n’Ụlọikpe gosikwara mkparị, ka ọ nọ na-aba mba na-aka ya dị ọcha. Ogige ụlọikpe abụghị ọdụ ịkpọ ekwentị (call Centre) ebe mmadụ nwere ike ịkpọ ma ọ bụ zaa ekwentị ka ọ masịrị ya.

Hmm, onye kpatara nkụ ahụhụ sịrị ngwere bịara ya ụgwọ  Nwa amadị jiri aka ya kotere onwe ya okwu.

Leave a Reply

Your email address will not be published.