PITA OBI NA CHEKWAS GA-ALAGHACHI APGA- EDOZIE NJỌKỤ

Spread the love

Abụja – Otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Grand Alliance (APGA) nke Ichie Edozie Njoku nọ n’isi ya ekweela nkwa ịmalite mkpezi ozigbo n’etiti ndị ndịsonwere otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ, ma ndị pụrụ apụ ma ndị ka nọ ya, iji kwadebe maka nhọpụta ndị dị n’ihu.

Njọkụ kwuru nkea n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’Abụja ụbọchị Mọnde ka ụlọikpe nyere mkpebi na ọ bụ ya bụ Nnukwu Onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA.

“Anyị ga-amalite mkpezi iji weghachikwa APGA n’ọnọdụ ndị tọrọ ntọala ya debere ya.

http://www.hoohaa.com.ng/2019/07/04/apgansogbu-oye-kariziri/

” Ma i mejọrọ APGA, ma APGA e mejọrọ gị  anyị nile ga-ekpezi dịka ụmụnne. Ma Pita Obi, onye mbụ jiri aha APGA were bụrụ Gọvanọ ma Chekwas Okorie, onye bụ Nnukwu Onyeisi oche APGA nke ntọala, anyị ga-akpọghachite mmadụ nile”

“Iji gbasanwuo oke otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ dị n’ala anyị mgba, APGA ga-ahazigharị onwe ya nke ọma”

Ichie Edozie Njọkụ na Ichie Viktọ Oye, onye bụbu Nnukwu Onyeisi Oche APGA na Naịjiriya nọ n’Ụlọikpe kemgbe afọ gara aga.

N’abalị mbụ nke ọnwa Juun, afọ 2019, otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA mere ọgbakọ nhọpụta abụọ.

Nke e mere  n’Owere họpụtara Ichie Edozie Njọkụ dịka  Onyeisi Oche ebe nke e mere n’Ọka họpụtakwara Ichie Viktọ Oye.

Kaosiladi, a tụrụ anya na ọgụ ebiela site na mkpebi ụlọikpe ahụ, ọ kacha ebe Ọkaiwu na anọchiteanya Oye jiri aka wepụ akwụkwọ ọ gbaburu iji gbochie Njọkụ ịga n’ihu n’ọrụ ya dịka Onyeisi Oche otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA.

Hmm, Chukwu hụrụ Ndigbo n’anya ime ka APGA si etu a kpezie ugbua

Leave a Reply

Your email address will not be published.