ỤKỌCHUKWU ASỤGBUOLA NWUNYE YA, SỤGBUO ONWE KA A NA-AKA ỤKA

Spread the love

Elijah Misiko, Osote Ụkọchukwu nke ụlọ ụka, Ground for God’s Gospel Church na Mombasa, Kenya ka a na-aka ụka, biliri n’oche ya n’ihu oche, gakwuru nwunye ya, Ụkọchukwu Ann Mughoi, n’elu ebe nchụàjà were mma o zoro n’ime envelopu sụọ ya

Nkea mere ụbọchị ụka, site n’okwu Juliọs Kiragu, Onye nlekọta ndị Uwe Ojii na Mombasa,

“Ọ gakwuuru nwunye ya ka ụka ahụ nọ n’ekpere”. Ọ sụrụ ya mma ugboro abụọ, sụọ onwe ya mma n’afọ ugboro atọ ma yibie onwe ya olu”

Misiko nwụrụ ozigbo ahụ mana nwunye ya nwụziri n’ụlọ ọgwụ.

O teela ha abụọ ji azọ onye nwe ụlọ ụka ahụ. N’afọ 2017, ndị Uwe Ojii kpọchiburu Misiko ka nwunye wetara mkpesa na ọ chọrọ igbu ya.

Ndị Uwe Ojii tọhapụkwara ya maka na ha sị na ha chọpụtara na ebubo ahụ abụghị eziokwu. Ha mụtara ụmụ anọ mana ha bi iche iche kemgbe okwu ahụ malitere.

Misiko hapụrụ edemede egbum onwe, ebe o boro Mughoi ebubo iwepụ aha ya dịka Onye so nwere ya bụ nke ọ sịrị na ha abụọ tọrọ ntọala ya.

E burula ozu ha abụọ buga n’ọba ozu Coast General Hospital na Mombasa.

Hmm, arụ kwọ nwa n’azụ! Maka ego nakwa oke ọchịchọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.