ENUGWU: AKA AKPARALA NDỊ NTỌ NDỊ FULANI NA-AKPA IKE

Spread the love

Enugwu – Aka ndị Uwe Ojii akparala ndị ntọ ndị Fulani mmadụ atọ na-akpa ike n’Enugwu Steeti.

Ha gụnyere; Adamu Mohammed (Taraba Steeti) , 25, Musa Ibrahim (Katsina Steeti) , 28, na Dauda Alhaji ( Nasarrawa state), 31 bụ ndị Uwe Ojii jidere n’ebe ha zogasịrị n’Ebọnyi Steeti n’abalị iri n’asatọ nakwa abalị iri abụọ n’abụọ nke ọnwa Jenụwarị afọ a.

Ọ bụ ha tọọrọ  Fada Cyprian Ugwuanyi, bụ ụkọchukwu na-elekọta Ụlọ ụka Onye Nsọ Pọl, Ogbosu Umulokpa n’okpuru ọchịchị Uzo-Uwani nke Enugeu Steeti n’abalị iri nke ọnwa a n’ụzọ awara awara si Ezeagụ jee Ụzọ Ụwanị.

Ha tọkwaara Onyeisi ndị Inyom nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP n’Okpuru Ọchịchị  Igbo-Etiti, tinyere nwa ya nwoke nakwa onye ọkwọ ụgbọala ya n’abalị iri abụọ n’otu nke ọnwa Disemba afọ 2019.

Ka ọ na-eme ngosipụta ndị omekome ahụ n’Enugwu, n’isi ụlọ ọrụ Ndị Uwe Ojii ngalaba Enugwu, Kọmishọna ndị Uwe Ojii na steeti ahụ, Ahmed Abdurrahman kwuru na a nwuchikọrọ ha site n’ọsọ eleghị anya n’azụ ndị Uwe Ojii chụrụ ha.

“Ndị Uwe Ojii chụrụ ya were ruo n’otu ebe ha zoro onwe ha. Anyị sochiri ha azụ ma nwuchikọọ ha n’ebe ha zogasịrị n’Ebọnyị Steeti.

“A ga-akpụpụ ha ụlọikpe ma anyị mechaa nnyocha.

Ihe e nwetara n’aka ha gụnyere: Otu egbe agha AK47, egbe Ọka atọ nakwa mgbọ egbe.

Hmm, ndị Uwe Ojii Enugwu na-agbakwa mbọ. Kaosiladi, ndị mmadụ na-ajụ ma ndị Uwe Ojii akpụpụwo ndị Fulani ha jide uru na mbụ, ndị gburu Fada Offu ụlọikpe?

1 Comment

  1. Unu e meela. Daalunu! O Kasi, n’asusu Igbo nke unu ji alu olu.

    Obi juru m n’anuri.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.