Enugwu –  Ndi bi n’Enugwu ekwuola “waawa!” na ha anabataghị mbuli ụgwọ ọkụ ọbụla. Nkea pụtara ìhè ụnyahụ n’ọgbakọ ndịsonwere nke ụlọ ọrụ nkesa ọkụ Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) chịkọbara n’ụlọ nkwari akụ Bon Sunshine Hotel, Enugwu maka atụmatụ ibuli ụgwọ ọkụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ala anyị.Read More →

Vatikan -Poopu Fransisi adaala n’ọrịa amabeghi aha ka ya na ndị na-arịa Coronavirus nwechara ọgbakọ ụbọchị Wenezdee Ntụ. Ndị ọrụ Vatikan ekwubeghi ọrịa ji ya bụ Onyeisi ụka Katọliki na mbaụwa mana ọ nọ na-akwa ụkwara na-ezikwa imi oge ọ na-ekwu Mass Wenezdee Ntụ. N’okwu ya ya bụ ụka WenezdeeRead More →

Legọs – Ụlọikpe nọ n’Igboshere, Legọs nọrọ ụnyahụ nye ikike nnara n’akaebe nde Naira iri abụọ maka Iyanya Mbuk, onye ọ́gụ́ égwú e boro ebubo izu ohi ụgbọala. Ajụjụ dị ọhaneze n’ọnụ bụ : “Iyanya e zuru ohi ụgbọala, n’ezie?” Kaosiladi, Ọkaikpe Mobolanle Okikiolu-Ighile ekwuola hoo!haa! na nwoke a ụmụ  agbọghọRead More →

Abụja – Ụlọ ọrụ National electricity regulatory commission (NERC) enyela ntụziaka ka ụlọ ọrụ nkesa ọkụ (Discos) iri n’otu dị n’ala anyị ghara inye ndị n’enweghị mita ụgwọ ọkụ karịrị N1, 800 kwa ọnwa. Nkea bụ maka oke ákwá ndị na-amụ ọkụ n’ala a na-ebe maka akatamkpo ụgwọ mmagbunye haRead More →

Vatikan – Poopu Fransisi enyela ndụmọdụ ka ndị otu Kraịstị sọọrọ ọbaozi mmekọrịta (social media) nakwa televishọọnụ dịka ọpịpịa Lentị. Onye a bụ onyeisi ụka Katọliki n’ụwa gbaa gburugburu kwuru nke a ụnyahụ bụ Wenezdee Ntụ na Nzute Izugbe kwa izu ụka o nwere n’Ogige Onye Nsọ Pita na Vatikan.Read More →

Asaba – Ndi Okenye arụrụ ala n’Okwe nke didebere Asaba na Delta Steeti agwala otu nwanyị, Grace Eze, na ọ ga-akpụ arụ maka ikpesara ndị Uwe Ojii na di ya, Maịkel Eze, 42, dinara nwa ya nwanyị Chidịmma, 14, n’ike ma wepụkwa afọ ime ya ka ọ tụwara ya ime.Read More →

Abụja – Ụlọ ọrụ Nigerian Electricity Regulatory Commission (NERC) nọrọ taa bụ  abalị iri abụọ n’ise nke Febrụwarị afọ 2020 were malite mkparịta ụka nke ga-agazu mpaghara Naịjiriya nile maka okwu ibuli ụgwọ ọkụ nke nwere ike ịmalite n’ọnwa Eprel afọ a. Site n’ozi si n’aka Onyeisi Oche ụlọ ọrụRead More →

Enugwu – Sinetọ (Ọkammụta) Ike Ekweremadụ, CFR, Onye jibu ọkwa dịka Osote Onyeisi Sineti Naịjiriya ekwuola na ya na ndị otu ya batara n’ọchịchị iweta mmepe na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Enugwu nile, n’agbanyeghị otu ndọrọndọrọ ọchịchị onye nọ. Ekweremadụ nyere nkọwa a na nso a oge ọ gara ileta etuRead More →

Abiokuta – Ngalaba ndị Uwe Ojii na-achụ ndị oji-egbe-ezu (SARS) egbuola onye ọgba bọl nke otu egwu bọl Remo Stars, Tiyamiyu Kazeem, n’ebe Orile Imo dị n’ụzọ awara awara Shagamu – Abiokuta, Ogun Steeti ụnyahụ. Ndị Uwe Ojii ahụ jidere ya na ọ bụ onye ‘yahoo’ oge ya na onyeRead More →

Legọs – Ọtụtụ mmadụ akatọọla okwu Ụkọchukwu Enọk Ade Adeboye, Onye Nlekọta Gburugburu, Ụlọ ụka Redeemed Christian Church of God (RCCG) maka ozi ya na Twitter ebe o kwuru sị, “Ụmụ m nwoke, unu anụla nwanyị amaghị esi nri. O kwesịrị ịma ịrụ ọrụ ụlọ nakwa isi nri maka naRead More →

N’aha ike ekike, ụmụ agbọghọ jizi aka ha eme onwe ha ndị ara. Bikonu, mmadụ abụọ a nọ n’onyonyoo a yicha akwa dọkara adọka. Kedụ onye isi dị mma? Kedụ onye nke bụ onye ara. Ọ nwere mgbe ụmụ agbọghọ bidoro mewe isi a na-akpọ “ịka m ayị ara?” N’imeRead More →

Ado Ekiti – Kọmishọna na-ahụ maka Ikpe Nkwụmọtọ n’Ekiti Steeti, Mazị Olawale Fapohunda ekwuola na Gọvanọ Steeti ahụ  Kayọde Fayemi enyela ntụziaka ka a tụgharịa iwu hiwere atụmatụ nchekwa Amotekun nakwa ndị ọzọ nke Steeti ahụ n’olu Yoroba. Usoro iwu nke e ji ehiwe atụmatụ nchekwa a kpọrọ  Ekiti StateRead More →

Enugwu – Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Enugwu Steeti akpọkuola Gọọmenti Etiti ka ọ napụ ụlọ ọrụ nkesa ọkụ EEDC ikike ịbụ sọọsọ ụlọ ọrụ nkesa ọkụ dị na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda Naịjiriya. Ụlọ Nzukọ a katokọwara ụlọ ọrụ EEDC maka edebeghi iwu ụlọ ọrụ NERC etu o siri metụta ndịRead More →

Nsụka – Ọkụ adogbuola otu “onye barrow” na Nsụka ụnyahụ ka ọ gara ịghọta mangoro n’akụkụ ụdọ ọkụ “High Tension” n’ụzọ bịawara Enugwu. Chetakwa na Onyeisi oche Okpuru Ọchịchị Nsụka, Oriakụ Chinwe Ugwu nwere ndị ntorobịa ọ kwalitere ndụ ha afọ gara aga site na ibunye ha barrow ka haRead More →