DỌKỊNTA ARTHUR NWANKWỌ ANWỤỌLA

Spread the love

Enugwu – Dọkịnta Arthur Awguncha Nwankwo( Ikeọgụ) Onye nlekọta Ukwu (Chancellor)  Eastern Mandate Union (EMU) ma bụrụkwa onye jibu ọkwa dịka Osote Onyeisi Oche otu NADECO.

Ya bụ nwoke so na ndị lụrụ ọgụ ịhụ na ọchịchị ndị soja kwụsịrị, ọchịchị Ọhakarasị were lọghachikwa na Naịjiriya nwụrụ n’ebe elekere abụọ nke ehihie taa bụ abalị mbụ nke ọnwa Febrụwarị afọ, 2020 n’ụlọ ọgwụ UNTH, Enugwu.

Ọ rịara ahụ nwa obere oge tupu wee laa mmụọ.

Okosisi Ndigbo adaala. Ikeọgụ, Arthur Nwankwọ bụ onye Ndigbo ga-echeta dịka onye zụpụtara ọtụtụ ndị Igbo ji eme ihe dịka ndị na-eso ụzọ ya.

Ndị a Ikeọgụ zụpụtara gụnyere Dọkịnta Udenta O. Udenta, Ike Obosi Osita Chidọka, Ọkaikpe Chijioke Edeoga, wdg.

Ikeọgụ laa n’udo.

Leave a Reply

Your email address will not be published.