DIBỊA EZE NWANYỊ NDỊ YAHOO ANWỤỌLA

Spread the love

Bini – Oriakụ Agnesị Ụwadịa, onye ama dịka Iye yahoo ma ọ bụ Ịya yahoo, onye Idumuebo dị n’Edo Steeti anwụọla.

Nwanyi ahụ bụ dibịa eze nwanyị bụ ọkaibe na imere ndị Yahoo ọgwụ ha ji anapụ ndị ‘mugu’ ego.

Dị ọkpara ya kọwara na Iye yahoo labara mana o tetaghị ka chi bọrọ. O kwukwara na o nweghị ihe ọbụla na-eme ya oge ọ labara.

Ndị yahoo bịara inweta ọgwụ n’aka ya jụpụtara na iru uju. Ụfọdụ n’ime chọrọ ibuga ya Ịndịya, ka a mara ma ọ ga-ebilinwu.

Iye yahoo na-ejibu ime tupu ọ banye n’ime ọgwụ yahoo. O nwere ụgbọala ‘jeep’ dị iche iche ise ma rụkwara ụlọ elu nkwago atọ

O wetaara ndị ogbe ya ọkụ, gbapuoro ha mmiri ma rụkwara ụlọ akwụkwọ.

Ndị mmadụ si Edo, Delta, Anambara, Kogi, Benuwe, Ogun, Legọs, Ondo nakwa Osun Steeti achọ ya abịa.

Emeka, otu onye n’ime ndị yahoo dịka ọnwụ nwaanyị ahụ akacha wute ya.

Kedụ ihe o ji bụrụ ugbua m matara nwanyị a ka ọnwụ bịara gbuo ya? Kedụ udiri ajọ chi bụ nkea”

Hmm, ụwa nkea sef! Ọtụtụ ihe na-emekwa n’okpuru anyanwụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.