CHAỊ! ONYE UWE OJII EWERELA ỤRA MAPỊA DỌKỊNTA ANYA N’ỤLỌ ỌGWỤ

Spread the love

Abakaliki – Njinji na-eji ugbua n’Ụlọ Ọgwụ Alex Ekwueme Federal University Teaching Hospital, Abakaliki, Ebọnyi Steeti, ebe otu nwoke onye Uwe Ojii jiri ụra chara acha mapịa otu Dọkịnta nọ ọrụ ebe ahụ anya.

Ihe butere nkea bụ na nwa ya bụ onye Uwe Ojii nwụlahụrụ ya n’ụlọ ọgwụ ahụ. O wee bukwasịzịa onye dibịa oyibo ahụ iwe n’ọnụma juru ya n’obi.

O dobeghi anya bụ ka okwu ahụ siri malite were ruo nke ịma ụra mana otu ihe doro anya bụ na afọ ejughi nwamadi ahụ etu Dọkinta ahụ siri saa ya okwu  nakwa ka ndị otu ya siri rụdebe ọrụ ahụ n’isi nwa ya nwoke ahụ nwụrụ n’ụlọ ọgwụ ahụ.

Kaosiladi, ozi anyị nwetara bụ na Dọkịnta ahụ ritere ụra ọkụ n’aka onye Uwe Ojii ahụ esoghị na ndị letara nwa ya tupu ọ nwụọ.

Kaọdị ugbua, ndị Dọkịnta nọ n’ụlọ ọgwụ ahụ nọ ọgbakọ mberede nke nwere ike ibute na ha ga-akwụsigodu ọrụ ruo na e lebanye anya n’okwu mmekpa ahụ e nyere onye otu ha.

Hmm, ọtụtụ oge, ndị Dọkịnta, ndị nọọsụ tinyere ndị ọrụ ahụike ndị ọzọ anaghị eji ihe metụtara ndị ha na-elekọta akpọrọ ihe.

Kaosiladi, o zighikwa ezi bụ onye uwe iji ụra were sachie nwoke ibe ya anya. Nwa mmụọ emegbula nwa mmadụ ma nwa mmadụ emegbukwala nwa mmụọ

Leave a Reply

Your email address will not be published.