NDỊ NDU NDIGBO CHỌRỌ ỊKWATU ỌCHỊCHỊ BUHARỊ – GỌVANỌ ỤZỌDỊMMA

Spread the love

Owere –  Gọvanọ Hope Uzodinma nke Imo Steeti ekwuola na ndị ndu Ndigbo ndị nọ na PDP na-akpa nkata ịkwatu ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buharị.

N’ozi nke ya onwe ya tinyere aka, Ụzọdịmma kwuru na ngagharị iwe nke gazuru Naịjiriya nke ndị PDP na-eme maka mmeri o meriri n’Ụlọikpe Mkpedebe dịkwa ka ngagharị iwe nkwatu ọchịchị obodo nke ndị ‘Revolution Now’ .

O kwuru na ndị a na-eme ngagharị iwe a nwere ihe ọzọ ha bu n’obi maka na ha ma na Ihedioha enweghị oge o jibu merie na nhọpụta ahụ tinyere na ha ma na site na mkpebi ụlọikpe mkpedebe na okwu ahụ aghọọla akụkọ mgbe ochie.

O kwuru sị, “Ngagharị iwe a bụ nkata a kpara akpa;ụzọ aghụghọ iji kwatuo Gọọmenti Etiti  Ọ dị mwute na ndị ndu Ndigbo na-akwado atụmatụ arụrụ ala a, were na-emezi onwe ha atụrụ eji achụ àjà ma na-etinyekwa ndụ Ndigbo bi n’akụkụ Naịjiriya nile na nsogbu”

“Ndi ndu Ndigbo ndị a iji ire ha gụọ eze ha ọnụ ma chọpụta na a na-ahụtazi ha dịka ndị azụghị azụ, ndị obi ọkụ na ndị nnupụisi  ndị e nwere ike iji bute ọgbaghara n’obodo.”

Ụzọdịmma kwukwara na ọ bụ ihe ihere na “Ndị ndu Ndigbo bụ ndị a ga-echeta maka ajọ akparamagwa nke ịkpọku ndị mba ndị ka ha bịa tinye aka n’usoro ọchịchị ala anyị”.

Na mmechi, Ụzọdịmma kwuru sị, “Ọ bụrụ na Ndigbo jiri aka ha chụpụ onwe ha n’ụgbọ, ebe ohere dịịrị onye ọbụla, ụta ga-adịrị ha ma akpachapụ ha n’ihe a na-eme”

Leave a Reply

Your email address will not be published.