2023 : PDP AWỤỌLA NDIGBO N’ALA

Spread the love

Abụja – Site na ịjụ ikenye Ndigbo (mpaghara Ọwụwa Anyanwụ) ohere ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjiriya n’aha ya na nhọpụta 2023, otu ndọrọndọrọ ọchịchị PDP awụọla Ndigbo n’ala.

Onyeisi oche izugbe PDP, Ichie Uche Secondus n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ ụnyaahụ kọwara na mpaghara nile nọ na Naịjiriya nwere ohere iji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ were zọọ ọkwa Onyeisiala n’afọ 2023.

Secondus kwuru sị, “Iwuala a nyere onye ọbụla ikike iso zọọ ọkwa ahụ,ma ị bụ onye Ugwu ma ị bụ onye Ndịda.

” N’agbanyeghị na e nwere mpaghara e kenyeburu ya, o  nweghị onye ga-egbochi onye ọbụla iso zọọ ọkwa ahụ.

Onye ọbụla tozuru ịzọ ọkwa Onyeisiala nwere ohere ịzọ”

Ndigbo, ndị  na-ekwusi ike na ọ bụ Ndigbo ka o ruuru ịbụ Onyeisiala n’afọ 2023 hụtara okwu a dịka ịwụ Ndigbo n’ala n’agbanyeghị ahụhụ nile Ndigbo taworo PDP.

Kaọdịtaa, PDP dịzị ka ọ bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị Ndigbo maka na ọ bụ ndị hiwere ya ma bụrụkwa ha mere o ji dị ndụ ruo taa.

N’agbanyeghị nkea, PDP ahụtaghị ya ka ihe dị mkpa, ikenye Ndigbo ohere ịzọ ọkwa Onyeisiala n’aha ya n’afọ 2023 iji tie ha aka n’obi maka mbọ ha gbawooro otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ.

Ụfọdụ kwenyere na ọ bụ ihe ndị a ka Sinetọ Enyinnaya Abaribe hụchara o jiri kwuo na ihe ka Ndigbo mkpa ugbua bụ Nghazigharị Usoro Ọchịchị obodo karịa ịzọ ọkwa Onyeisiala, ebe ọ bụ na Ndigbo ejighị ndị isi ọchịchị otu ndọrọndọrọ ọchịchị abụọ gbara ọkpụrụkpụ na Naịjiriya bụ APC na PDP n’aka.

Hmm, “ihe okenye nọ n’ala hụ nwata rie elu, ọ gaghị ahụ ya”

Leave a Reply

Your email address will not be published.