EKWEREMADỤ AGBAGHEELA OGIGE NNYOCHA SAYENSỊ RT. HON. TOBI OKECHUKWU WETARA NA NDIAGBỌ

Spread the love

Agụmakwụkwọ bụ sọọsọ ihe ga-eme ka mmadụ nwee agamnihu karịa ọnọdụ ọbụla a mụnyere ya n’ime ya- Rt. Hon. Okechukwu 

Enugwu –  Ọkammụta Sinetọ Ike Ekweremadụ nọrọ ụbọchị Mọnde were gbaghee Ogige sayensị nke Rt. Hon Tobi Okechukwu wetara n’Ụlọ akwụkwọ Sekọndịrị Nkanụzụ, Uhugo, Ndiagbọ nke dị n’Okpuru Ọchịchị Anịnri, Enugwu Steeti.

Ụlọ ọrụ Scientific Equipment Development Institute, SEDI, Enugwu bụ ndị rụpụtara akara ngwa ọgbara ọhụrụ ndị e tinyere ebe ahụ maka ọmụmụ Fiziks, Kemịstrị nakwa bayaloji.

N’okwu ya, Sinetọ Ekweremadụ kọwara na ụlọ akwụkwọ ahụ dị oke mkpa maka agamnihu nkanụzụ na sayensị nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda.

“Nkanụzụ bụ ọdịịche dị n’etiti mba ndị mepere emepe na mba ndị ọzọ. Ya mere mba ndị dị ka  Amerịka, Briteenụ na Singapore ji etinyesi ego ike n’agụmakwụkwọ.

http://www.hoohaa.com.ng/2019/12/05/omereoha-rt-hon-tobi-okechukwu-o-mere-oha-nezie/

“Ihe anyị na-eme ebe a taa bụ iweta ezigbo ụzọ maka agụmakwuwo sayensị na nkanụzụ na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Enugwu nakwa n’Ala-Igbo nile”

Ekweremadu toro Okechukwu, onye bụ Osote Onye ndu ndị n’anọghị n’ọchịchị n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu nta ala anyị maka omalincha atụmatụ ahụ. Ọ katọkwara ndị ọchịchị na-achọ sọọsọ maka onwe ha, ndị na-achọ ka ihe mmepe Gọọmenti nile dị sọọsọ n’obodo nke ha.

“Ka anyị na-abịa, anyị gafere ụlọ akwụkwọ dị n’obodo ya n’enweghị ogige nnyocha sayensị, mana Tobi hapụrụ ebe ahụ bịa bute ihe a ebe a.

“Ọhakarasị bụ usoro ọchịchị maka “e nye ndị ebea, e nyekwa ndị ebea”, ihe a na-egosi udiri ndị ndu anyị nwere na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Enugwu”

N’okwu ya, Rt. Hon. Okechukwu kwuru na ya nwere afọ ojuju ịhụ na a rụchara ma gbapekwaa ya bụ ogige sayensị ụlọ akwụkwọ ahụ.

“Kaosiladi, a chọrọ m ịrụtụ aka na ndị Naịjiriya dị mma na ịrụ ihe, mana anyị amaghị ilekọta ihe anyị rụrụ anya. N’ihi ya, a na m arịọ ndị obodo a ka ha chekwaa ha chekwaa ihe a e wetara ha, maka ndị omekome”

Ọ nyekwara ụmụ akwụkwọ ahụ ndụmọdụ:

“Agụmakwụkwọ bụ sọọsọ ihe nwere ike ime ka mmadụ nwee agamnihu karịa ọnọdụ amụnyere ya n’ime ya.

“Agụmakwụkwọ mere Ikeọha jiri gaa Sineti  ma kpaa ike nile ọ kpara. Agụmakwụkwọ mere m jiri gakwaa Ụlọ Nzukọ Omebeiwu, bụrụkwa ya ga-eme ka unu bụrụ ihe ọbụla unu chọrọ ịbụ n’ụwa.

“N’ihi ya, anyị agaghị ala azụ na iwetara ndị be anyị akarangwa agụmakwụkwọ dị iche iche”

N’okwu nke ya, Kọmishọna Enugwu Steeti na-ahụ maka Sayensị na Nkanụzụ, Ichie Obi Kama kelere Okechukwu n’ụzọ pụrụ iche maka ya bụ ihe o wetara n’ụlọ akwụkwọ ahụ.

Ndị ọzọ nwere agba bịara mmemme ahụ gụnyere Hon. Chinedu Okwu, onye nnọchiteanya mpaghara Anịnri n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Enugwu Steeti, Hon. Jọnsin Chukwuọbasi, onye nnọchiteanya mpaghara Ndịda Ọgwụ n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Enugwu Steeti, Igwe Ben Eze, eze ọdịnala, Ndịagbọ, Ọkammụta Sam Ndụbụisi, Onyeisi Ụlọ ọrụ SEDI, Dọkịnta Ikechukwu Gọdwin Udeuhele, onye jibu ọkwa dịka Kọmishọna na-ahụ maka Mgbasa ozi n’Enugwu Steeti, wdg

Tupu nkea, e bụrụ ụzọ gaa na Mmakụ dị n’Okpuru Ọchịchị Ọgwụ, ebe Ekweremadu gbaghekwara ụlọ ọhụrụ Hon. Okechukwu rụrụ n’ụlọ akwụkwọ Praịmarị Central School, Mmakụ iji mejupụta nkwa o kwere ndị obodo ahụ oge ọ bịara achụmnta nkwado tupu nhọpụta afọ 2019.

Hon. Jọnsin Chukwuọbasi, onye bụ nwa-afọ Mmakụ ma bụrụkwa onye na-anọchite anya mpaghara Ndịda Ọgwụ n’Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Enugwu Steeti oge ọ na-ekwupụta afọ ojuju ya kọwara na ọtụtụ ndị nwere agba na Mmakụ, tinyere ya onwe ya bụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ ka ha gụrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.