NDỊ UGWU AMALITEWO ‘AMOTEKUN’ NKE HA, KEDU MAKA NKE NDIGBO?

Spread the love

Kaduna – Amotekun, otu nchekwa ndị Yoroba hiwere n’abalị itolu nke ọnwa Jenụwarị afọ a maka nchekwa mpaghara Ọdịda Anyanwụ ewetala mgbanwe pụrụ iche na Naịjiriya.

Kaọdịtaa, ndị Ugwu azaghachila azụ n’egbughi oge ọbụla site na itipụta ‘ijele’ nke ha a kpọrọ “Shege ka fasa” nke pụtara “Nwaa, ma ọ kaa gị obi” dịka otu nchekwa nke mpaghara ha.

Na Mmemme ngosipụta ejirimara otu “Shege ka fasa” nke e mere ụbọchị Wenezdee n’ụlọ Arewa dị na Kaduna, Alahaji AbdulAzeez Suleiman, Onyeisi otu ndị Ugwu a na-akpọ Coalition of Northern Groups (CNG) kwuru na ha edegarala ndị Gọvanọ nile nọ na mpaghara ahụ akwụkwọ maka nke a.

“Otu nchekwa a bụ maka ndị Ugwu nile, n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ okpukpere hi ọbụla. Ọ gana arụ ọrụ n’udi ga-akwalite ala anyị site na inyere ndị ọrụ nchekwa aka n’ọrụ ha”

N’udịrị yiwere ejirimara Amotekun bụ agụ, ejirimara Shege ka fasa bụ ọdụm na-agbọ ụja.

AbdulAazeez kwuru na ọ bụrụ na ndị Gọvanọ mpaghara ahụ jụ ikwado ha, na otu CNG ga-aga n’ihu inweta ziri ezi n’usoro iwu site n’aka ụlọ ọrụ Gọọmenti Etiti ndị kwesịrị ekwesị.

Chetakwa na CNG bụ otu ndị Ugwu gbabuuru Ndigbo bi  n’Ugwu Awụsa ụgbọ nwa mkpi n’afọ 2017.

Kaọdịtaa, ajụjụ dị Ndigbo n’ọnụ bụ “Kedụzi mgbe Ndigbo ga-amalite otu nchekwa nke ha?”.

Ọ na-adị mma, “Ihe kwụrụ, ihe akwụdebe ya” maka na “ụbọchị a mụrụ nwoke, ka a mụrụ ibe ya na mba”. O dokwara anya na Naịjiriya ji ụkwụ atọ kwuru, Igbo, Awụsa na Yoroba. Ndigbo, anyị a ga-eji ụjọ daara enwe n’elu ka ọ pụtara na mmadụ anọghịzị?

“Ụzụ amaghị akpụ ogele ya lee egbe anya n’odu”. Afọ ejughi ọtụtụ Ndigbo na ndị Gọvanọ mpaghara a ka nọ na edere Gọọmenti Etiti akwụkwọ, ebe ndị ọzọ maliteworo ihe ha chọrọ iji chekwaa onwe ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.