NGAGHARỊ IWE NUF EMEELA KA EEDC KWỤSỊ ATỤMATỤ ỊGBANWE MITA

Spread the love

Enugwu – Ụlọ ọrụ nkesa ọkụ EEDC akwụsịla atụmatụ ịgbanwe mita ndị ha kpọrọ ‘stand alone’ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda ala anyị.

Nkea bụ maka ngagharị iwe kpụ ọkụ n’ọnụ nke otu Ndigbo United Forum (NUF) mere n’ụlọ ndị EEDC na steeti dịgasị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda nke meziri NERC jiri teta n’ụra were kpọọ ọgbakọ mkpezi n’etiti ndị EEDC na ndị  NUF n’Enugwu ụbọchị Tuuzdee nke ndị nnọchiteanya Gọọmenti steeti mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda bịakwuru.

Ozi nke Onyeisi Mgbasa Ozi, EEDC, Mazị Emeka Eze wepụtara kwuru sị:

“EEDC ekpebiela ịkwụsịgodu atụmatụ ịgbanwe mita ‘standalone’ wee ruo na ebutekwuo mita ọgbara ọhụrụ ‘Smart mita’ iji gaa n’ihu na atụmatụ mgbanwe mita ahụ.”

N’ihi nkea, ndị ahịa ha ndị ebupubeghi mita ha nwere ike ịgazị ga zụta ọkụ n’ụlọ ọrụ EEDC dịgasị n’ebe ndị a: Ọkụnanọ, Abakpa, Ọka, Ọnịcha, Owere, Owere Ọhụrụ nakwa Nnewi.

EEDC gwakwara ndị n’enwetabeghi mita tinyere ndị nwere mita ‘standalone’ ka ha gbaa mbọ nweta mita site na isonye n’atụmatụ inweta mita Gọọmenti Etiti bụ Meter Asset Provider (MAP).

Kaọdịtaa, onye bugodi Odeakwụkwọ Ukwu nke NUF, Mazị Agọdị Kanụ, n’ozi nke o tinyere aka gụpụtara mkpebi ha na ndị EEDC nwere.

“NERC kpebiri na EEDC ga-akwụsị ibupu mita ‘standalone’ ma hụkwa na ndị ebupuworo nke ha nwetara mita ọhụrụ N’AKWỤGHỊ ỤGWỌ ỌBỤLA.

“NUF dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ikwe ka ndị ọrụ EEDC bupu mita ha, n’ejighi nke ọhụrụ dochie ya.

Ndigbo,  unu ahụla na ọ bụ anyị ji onwe anyị. Ụbọchị ọzọ, a kpọọ oku maka ime ngagharị iwe pụta, ọ gaghị ala n’iyi. Ọ bụkwa ikikere i nwere dịka nwa amaala n’usoro ọchịchị Ọhakarasị.

Ị hụ onye ọbụla bụ onye NUF, tuo ya ‘ogbuagụ’  jikwara aka abụọ kwe ya n’aka. I nwezia ihe dị gị n’akpa, zụnye ya otu Ololo iji jaa ya ike na gbakwaa ya ume maka na ọgụ ebibeghikwa

Leave a Reply

Your email address will not be published.