ZEERE ỤMỤ NWANYỊ YI JIGIDA N’UKWU

Spread the love

Jigida, ụmụ nwanyị na-eyi n’úkwù bidoro wuwe ọzọ.

Kaọdịtaa, ọtụtụ ụmụ nwanyị, ọ kacha ụmụ agbọghọ na-eyizi Jigida n’úkwù.

Mana mere ekike ji malite wuwekwa ọzọ? Gịnị bụ ebumnuche ndị a na-eyi Jigida?

Ụfọdụ ji ya achọ mma. Ndị ọzọ sị na ha ji ya eme ka ha ghara ibu ibu ebe e nwekwara ndị na-eyi ya maka na ha na-achọ nwa.

Kaosiladi, ọtụtụ ụmụ agbọghọ jizi Jigida ha yi n’úkwù emenwe ụmụ nwoke egwu.

Nkea na-eme ugbua bụ na ụmụ agbọghọ na-ejizi Jigida ha yi n’úkwù ekechi ụmụ nwoke.

Ndị ụkọchukwu nakwa ụlọ ekpere dị iche iche na-agbazi ama maka ụmụ nwoke ụmụ agbọghọ ndị a na-eyi Jigida n’úkwù laworo n’iyi.

Nwoke ọbụla ya na ha nwere mmekọahụ eduola! Ha ga-ekechizi onye ahụ, were ya machie n’isi ákwà. Ọ gaghịkwa enwe uche aka ya.

Jigida ndị a nwere aha dị iche iche site na ọrụ nke ọbụla na-arụ.

Aha ụfọdụ Jigida ndị a gụnyere: Jigida anya ‘blue’, Jigida inweta isi ọma, Jigida nkéchi, wdg.

Hmm, ụmụ nwoke, kpacharanụ anya. N’agbanyeghị ka akwara si akọ gị ọkọ, ịhụ nwanyị yi Jigida n’úkwù, gbalagakwa.

Leave a Reply

Your email address will not be published.