NWOKE GBAGBURU ONYE NYỤRỤ MAMỊRỊ N’EZI AGAALA NGA MKPỤRỤ ỌKA

Spread the love

Kristova Poole, nwoke onye omekome gbagburu nwa-afọ Naịjiriya, Rasheed Olabode maka ịnyụ mamịrị n’okporo ụzọ abụrụla onye a tụrụ nga mkpụrụ ọka ụbọchị Tuuzdee na Newark, New Jersey, mba Amerịka.

Poole, onye otu nzuzo ogbe bụ ‘blood’ gbara Rasheed, onye ose foto dị iri afọ abụọ n’asaa egbe n’obi iji dulaa ya mmụọ dịka onye ọ mara ikpe ọnwụ n’agbanyeghị na ọ chịliri aka elu na-arịọ ya biko.

N’ọnwa Eprel, 2018, Poole hụrụ Rasheed ka ọ na-anyụ mamịrị n’akụkụ ụgbọala were wakpo ya.

Ọkaiwu Gọọmenti ji okwu ahụ, Jason Goldberg gwara ụlọikpe sị:

“Sọọsọ ihe ọjọọ onye a laworo mmụọ mere bụ ịnọ n’ihu afọ mmadụ were nyụọ mamịrị”

“Sọọsọ ihe nkịtị a, ihe onye ọbụla na-eme kwa ụbọchị zuuru Mazị Poole iji gbaa nwoke a egbe n’obi were dulaa ya mmụọ, ka ọ nọkwa na-arịọ ya ”

Ọkaikpe Ronald Wigler rụtụkwara aka na Poole egosighi mwute ọbụla chaa chaa maka ịnọ n’ihu mmadụ abụọ ndị enyi Rasheed were dulaa ya mmụọ.

” Ihe a bụ ikpe ọchụ m kpeworo kacha arụrụala kacha agbawa obi”

Leave a Reply

Your email address will not be published.