NDỊ UWE OJII AKPỌCHIELA NWOKE SINETỌ ANYỊM NA ANARA ALA YA

Spread the love

Abakaliki – Mazị Mosis Ọjị, 76, ka Ichie Anyịm Payọs Anyịm, onye jibu ọkwa dịka Onyeisi Sineti Naịjiriya nyere ntụziaka ka a kpọchie na ngalaba ime nnyocha (CID) Ndị Uwe Ojii n’Abakiliki ụbọchị Wenezdee.

Ihe dị mwute bụ na nwoke ahụ wetara mkpesa n’ụlọ ọrụ ndị Uwe Ojii dị n’Ivo na ndị Anyịm dinyere ji ụgbọala nkwari(bulldozer) were na-akwarikọ ugbo ya n’Ishiagụ dị n’okpuru ọchịchị Ivo nke Ebọnyị Steeti.

Nwamadi, onye sị na Anyịm chọrọ ịnara ya ala ya n’ike gbara akwụkwọ n’Ụlọikpe.

Ka a bịara ụlọikpe n’abalị iri abụọ n’asatọ nke ọnwa Jenụwarị, Ọkaikpe Ọnwụsi higharịrị okwu ahụ ka ọ bụrụ n’abalị anọ nke ọnwa Febrụwarị.

N’agbanyeghị nkea, ụgbọala nkwari ahụ laghachiri n’abalị iri atọ nke ọnwa Jenụwarị gakwaa n’ihu imebisi ihe nile nwoke ahụ kọrọ n’ugbo ya.

Ọjị kwuru na ndị uwe ojii bịara hụ ihe e mebiri n’ugbo ya ma gwakwa ya ka o dee  akwụkwọ nkọwa.

Ọjị sịrị na ọ tụzịrị n’anya etu ndị Uwe Ojii siri tụgharịa kpụrụ ya kpọchie maka akwụkwọ mkpesa Anyịm degaara Onye Nlekọta Izugbe ndị Uwe Ojii ala anyị.

Ndị ọ obodo ya bụ Ovumte dinyeziri Ọkammụta Ọnụ nke Mahadum Ebọnyị Steeti nke meziri ka a tọhapụ nwoke ahụ ka ọ na-achọzị ịkụ elekere isii nke mgbede.

Ọkaiwu nwoke ahụ, Ọkaiwu Ogbonna Pọl Arọchukwu, kwuru sị :”Ihe Anyịm na-emezi bụ iji ndị Uwe Ojii emekpa ndị ọ na-anara ala ha ahụ. Ịsị anyị bịa Abụja ebe okwu nọ n’ihu ụlọikpe na steeti a bụ ụzọ ha chọrọ iji were kpọchie anyị n’agbanyeghị na nkea megidere mkpebi ụlọikpe”

Ndi Ovumte jizi iwe maka mkpagbu a na-akpagbu nwa ha nwoke were dinye Ọkaiwu Chidi Nwogu, ọ gbara Anyịm akwụkwọ n’aha ha maka ịbanye n’ala mmadụ n’ike nakwa imebi akụnụba mmadụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.