BORONU: ZULUM EBULIWO ONYE NKUZI ONYE IGBO KACHA GBAA ỤZỌ BỊA ỌRỤ N’ỌKWA

Spread the love

Meiduguri – Ọkammụta Babagana Umara Zulum, Gọvanọ na-achị Boronu Steeti ebuliwo Oriakụ Ọbịageri Mazị, onye nkuzi o zutere n’Ụlọ akwụkwọ Praịmarị Shehu Sanda Kyarimi dị n’Okpuru Ọchịchị Jere n’elekere isii n’ọkara nke isi ụtụtụ n’ọkwa.

Ọkammụta Zulum gbara ụzọ bịa ụlọ akwụkwọ ahụ n’ije ntụmadị mana ọ tụrụ ya n’anya na ọ bụ nwanyị a bụ onye Isiala Ngwa, Abịa Steeti bụ sọọsọ mmadụ ọ hụrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ nile ka ọ nọ na-eche ka ụmụ akwụkwọ bịa akwụkwọ.

“6.30!” Ka Gọvanọ ahụ tiri iji gosi ka o siri tụọ ya n’anya. Nwanyị ahụ abụghị onye obodo ha mana ọ nọsịrị ike ebe ahụ na akuzi ụmụaka akwụkwọ n’agbanyeghị nsogbu nchekwa dị na steeti ahụ.

Zulum nọ ebe ahụ nye ya N100, 000 nke karịrị N35, 000 bụ ụgwọ ọnwa ya ugboro ugboro ma bulikwaa ya n’ọkwa dịka Osote Onyeisi Ụlọ akwụkwọ Praịmarị ahụ.

N’agbanyeghị na nwanyị ahụ agaghị mahadum, na sọọsọ ihe o ji bụ nzere mmụta NCE, Ọkammụta Zulum sịrị na o nwetara mbuli n’ọkwa ahụ maka ikuzi nkuzi iri afọ atọ n’otu nakwa site na ikike ya dịka Gọvanọ.

Hmm, bikonu, onye hụrụ Oriakụ Ọbịageri Mazị jaa ya mma, nwanyị a etuwela Ndigbo ugo, ọ bụkwa ugo n’onwe ya.

“Anya hụrụ ugo jaa ya mma, anaghị ahụ ugo daa”. Ndigbo kwesịrị imere nwanyị a mmemme. Ọ bụghị oge nile, a na-enweta sọọsọ akụkọ ọjọọ maka Ndigbo

Leave a Reply

Your email address will not be published.