UGOEZUE PAT AGỤBỤZỤ MERE MMEMME NCHETA ỌMỤMỤ IRI AFỌ ASAA YA TAA

Spread the love

Enugwu –  Ihe karịrị otu puku mmadụ bịara sonyere Lọlọ Ugoezue Pat Agụbụzụ bụ  nwunye Igwe Lọrịns Agụbụzụ, Eze Ọgbụnechendo n’Ezema Olo ma bụrụkwa Onyeisi oche ndị Eze n’Enugwu Steeti taa na  mmemme ncheta ọmụmụ ya nke iri afọ asaa ya.

E jiri ụka a kara n’ụlọ ụka Katọliki Atọ n’ime otu dị Ngọzị Independence Layout, Enugwu were malite ya.

N’okwuchukwu ya, Bishọọpụ Inyeaka nke Katọliki na Dayọsisi Enugwu, Bishọọpụ Enestị Anezichukwuihe Obodo rụtụrụ aka na mkpa ọ dị na ndị ụka, dịka  nnu na ìhè nke ụwa ga na-enyere mmadụ ibe ha aka.

Nna Ụkọchukwu ahụ kwukwara na ọ dị mma icheta mmadụ na ndụ, na echeweghi ka ọ bụrụ n’ọnwụ

“Ndi be anyị kwesịrị ịmụta ịja mmadụ mma na ndụ, ọ bụghị ịja ya n’ọnwụ”

Onye nochitere anya aka na-achị Enugwu Steeti, Ifeanyi Ugwuanyi na Mmemme ahụ bụ Ọkaiwu C. O. C. Egumgbe, Kọmishọna na-ahụ maka ndị Eze ọdịnala n’Enugwu Steeti.

Ndị nwere agba bịara mmemme ahụ gụnyere; Sinetọ Jim Nwobodo, Gọvanọ chịburu Anambara Steeti ochie, Ọkaikpe C. C. Nweze nke Ụlọikpe Mkpedebe Naịjiriya, Ọkaikpe M. P. Emehelu, Ọkaikpe Ukwu Enugwu Steeti, Ọkaikpe Chinwe iyizoba laworo ezumike, Ọkaikpe Matiu Eluke nakwa Ọkaikpe Harold Eya.

Ndị ọzọ gụnyere Igwe (Omenka) Ọstin Otiji nke Aguobu Ụmụmba, Igwe Julius Nnaji, Odezuligbo Nike, Sinetọ Ben Kọlins Ndụ, wdg.

N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ, Lọlọ Agubuzu kelere Chineke n’ụzọ pụrụ iche maka idebe ya ndụ ruo taa

“Na mbụ, a na m ekele Chineke maka idebe ndụ ruo taa n’ahụike. A na asịkwa ndị nile bịara nọnyere taa ka Chineke gọzie ma chekwaba unu”.

Ugoezue Pat Agụbụzụ na di ya, Igwe Lọrịns Agụbụzụ gbara akwụkwọ n’afọ 1972. Ha mụtakwara ụmụ ise.

N’ozi ya, Igwe Lọrịns Agụbụzụ kelere Chineke maka ihe ọma nile O mere na ndụ nwunye ya

“A na m ekele Chineke ka o siri nye m ọmalincha nwanyị dịka gị, onye lekọtara ụmụ anyị anya ma nyekwa ha ọzụzụ ziri ezi dịka onye nkụzi.

” Ọ dị ịtụ n’anya bụ etu i si eme ọfụma n’ọnọdụ ọbụla. Ma oge m nọ ọrụ dịka onye nnọchiteanya nakwa ugbua m bụ eze ọdịnala. I na-enye m nkwado zuru oke”.

1 Comment

  1. Chineke nke Igwe ndi agha chekwaba, gozibe gi loolo n’ ogologo afo ndi nke na- abia n’ ihu. Daalu, golibe na Chineke goziri gi.Amiiii




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.