AMOTEKUN NDIGBO: GỌVANỌ ỤZỌDỊMMA NA NDIGBO AKWỤKWA?

Enugwu –  Gọvanọ Hope Ụzọdịmma nke Imo Steeti abịaghị Ọgbakọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda mere ụnyahụ bụ ụka, abalị itoolu nke ọnwa Febrụwarị afọ 2020, n’Obi Gọọmenti Enugwu Steeti.

O nweghịkwa onye o zitere ka ọ nnọchiteanya ya.

Nke a gbara Ndigbo gbarịị dịka ahụ ijiji nyụrụ n’elu. Onye ọbụla na-ajụzị sị : “Gọvanọ Hope Ụzọdịmma na Ndigbo akwụkwa?”

O doro anya na okwu nchekwa ndụ n’akụnụba abụghị ihe e kwesịrị iji na-egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị. Ndị mwakpo ndị Fulani dabata n’obodo ịtọ ndị mmadụ, idina nwanyị n’ike ma ọ bụ ịla ndụ ndị mmadụ n’iyi, ha anaghị ajụ ma ị bụ PDP ma ọ bụ APC.

Ụzụ amaghị akpụ ogele lee egbe anya n’odu. Leenụ ndị Yoroba, ndị Mpaghara Ọdịda Anyanwụ Ndịda. Ka ha na ehiwe otu nchekwa ha bụ Amotekun, o nweghị Gọvanọ gụpụrụ onwe ya.

Ọbụladi odogwu ndị be ha, Tinubu, enweghị ike ịpụta katọọ ya bụ atụmatụ.

A tụrụ anya na Sinetọ Rochas Okorọcha, onye chịburu Imo Steeti, Ichie Achike Udenwa, onye chịburu Imo Steeti, Ahaejiagamba Ịma Iwuanyanwụ, Dọkịnta Jo Nwọgụ, onye ka rịturu n’ọkwa dịka Odeakwụkwọ Ukwu Ọhaneze tinyekwara ndị okenye ndị ọzọ n’Imo Steeti ga-enye aka gbaziere Gọvanọ ụzọ maka na “ọ bụghị sọọsọ onye nwụrụ anwụ ka a na arọzi olu” .

N’agbanyeghị na ọ bụ Onyeisi oche otu ndị Gọvanọ APC, Sinetọ Rochas Okorọcha, oge ọ bụ Gọvanọ Imo Steeti anaghị eji ọgbakọ Ndigbo egwu egwu.

Nkea mere Okorọcha jiri mefuo akatamkpo ego karịrị nde Naira iri asatọ iji rụọ ọmalincha isi ụlọ ọrụ ọgbara ọhụrụ maka otu Ọhaneze Ndigbo n’Enugwu.

Leave a Reply

Your email address will not be published.