EKITI: NDỊ DIBỊA ETIWO MKPU MAKA ARỤSỊ NA-AWỤ AKPATA OYI HA HỤRỤ N’IME ỌHỊA

Spread the love

Ado Ekiti – Ndi dibịa nọ n’Are-Ekiti dị n’Ekiti Steeti etiwo mkpu ka ụwa nụ olu ha maka arụsị na-awụ akpata oyi ha hụrụ n’ime ọhịa dị n’agbata ha na ndị Iworo.

Otu onye n’ime ha, Mazị Kunle kọrọ etu onye otu ha gahiere ụzọ n’ọhịa oge ọ gara ịkpata mgbọrọgwụ na mkpa akwụkwọ siri hụ ụlọ ahụ na-awụ akpata oyi n’ime ọhịa.

“Oge ọ kọọrọ anyị, ụfọdụ n’ime anyị soro ya ga hụ ihe ọ na-ekwu. Ihe anya anyị hụrụ tụrụ anyị n’anya. Anyị enweghịkwa ike ịmata onye nwe ụlọ arụsị ahụ”

O kwuru na ha hụrụ akpụrụ akpụ nakwa ihe ndị ọzọ gbara ha gharịị ebe ahụ.

Ndị dibịa ahụ sị na ihe ha ji eti mkpu bụ maka na ndị ọgwụ ego na ndị ntọrị karịzịrị n’obodo.

Kaosiladi, Abdulaziz, onye ọrụ ugbo si Ịgbịra, Kogi Steeti kọwara na ha na-ahụ ndị ha amaghị ka ha na-abanye n’ụlọ arụsị ahụ dị n’ọhịa a na-akpọ Ilede Okoparada.

Hmm, nsogbu dịkwa. Arụsị ndị dibịa hụrụ tie mkpu, ọ dịkwa egwu

Leave a Reply

Your email address will not be published.