ÌGWÈ BỤ IKE: IGBO EKPEBIELA IHIWE OTU NCHEKWA, MA NDỊ GỌVANỌ, MA ỌHANEZE

Spread the love

Enugwu – Igbo nile ekpebiela ihiwe otu nchekwa nke ga-echekwa ndụ n’akụnụba ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda.

Nkea sitere na mkpebi ọgbakọ abụọ e mere n’Enugwu ụnyahụ bụ ụka nke gbadoro ụkwụ n’otu isiokwu :Nchekwa Ala-Igbo.

Na mbụ, Imeobi Ọhaneze nwere ọgbakọ n’Ụlọ Nkwari akụ Nike Lake, Enugwu. Ndị nile Igbo ji biri bịara ọgbakọ ahụ.

Ụfọdụ ndịsonwere Ala-Igbo bịara ọgbakọ ahụ gụnyere; Ichie Nnia Nwodo, Onyeisi Ọhaneze Ndigbo, Sinetọ Jim Nwobodo, Gọvanọ chịburu Anambara Steeti ochie, Mazị Pita Obi, Gọvanọ chịburu Anambara Steeti ma bụrụkwa onye zọrọ ọkwa na nhọpụta gara aga n’aha PDP dịka Osote Onyeisiala, Ichie Achike Udenwa, Gọvanọ chịburu Imo Steeti, Ichie Ịma Iwuanyanwụ (Ahaejiagamba), Ọkammụta A. B. C. Nwosu, onye bụbu Mịnịsta Naịjiriya na-ahụ maka ahụike, Dọkịnta Jo Nwaọgụ, onye ka bụchara Odeakwụkwọ Ukwu Ọhaneze Ndigbo.

Ndị ọzọ gụnyere ndị Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Ala anyị dịka Sinetọ Enyinnaya Abaribe, Rt. Hon. Tobi Okechukwu, Osote Onyeisi ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị n’anọghị n’ọchịchị n’ụlọ Nzukọ Omebeiwu nta Naịjiriya nakwa Hon Kọnelus Nnaji, Onye Nnọchiteanya Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Enugwu.

Ndị ụkọchukwu bịara gụnyere Aachbishọọpụ Ịmanụwel Olisa Chukwuma nke Ụka Angịlịkan, Mpaghara Enugwu, Bishọọpụ Obi Ọnụbọgụ nke ụlọ ụka Rock Cathedral, wdg.

Ndị a bụ ndị mbụ na ndị ndu Ala-Igbo asọghị okwu anya chaa chaa, nke ha ji ata okwu eze.

Na mkpebi nke Onyeisi Ọhaneze Ndigbo, Ichie Nnia Nwodo gụpụtara kwuru sị:

“Ọhaneze ekwuola hoo!haa! na Ndigbo agaghị anọ na-ekiri a na-asụ ndị be anyị akwụ.

“Na Ọhaneze ga-echekwaba ndụ onye ọbụla nọ n’Ala-Igbo.

” Ọhaneze kpọlitere ma nyekwa Ọgbakọ ndị Okenye ya nke gụnyere ndịsonwere Ala-Igbo ka ha na ndị gọvanọ ọhaneze nwee mkparịta ụka ozigbo maka ọnọdụ nchekwa a.

Na mmechi, Ọhaneze sịkwara  “Onye akpakwala nwa agụ aka n’ọdụ” maka na dịka e ji mara ha, Ndigbo agaghị ala azụ na iji ọgụgụ isi nakwa obi dịmkpa chekwaa Ala-Igbo n’aka ndị mwakpo.

Ọhaneze ziteziri ndị okenye ndị bịara ọgbakọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda mekwara ụnyahụ ebe mmadụ nile nọrọ jiri otu olu nakwa otu obi kpebie ihiwe otu nchekwa Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ozigbo.

Ozi nke Gọvanọ Devid Nweze Ụmahị nke Ebọnyị Steeti ma bụrụkwa Onyeisi Oche Ọgbakọ ndị Gọvanọ Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ndịda gụpụtara kwuru na ha ekpebiela izigara Ụlọ Nzukọ Omebeiwu nile nọ na Mpaghara ahụ atụmatụ iwu ga-enye otu nchekwa mpaghara ahụ ikike ziri ezi.

Ụmahị kwukwara na ọ bụ site na mmekọrịta ha na ndị Ụlọ Nzukọ Omebeiwu ndị a ka a ga-esi wepụta aha otu nchekwa ahụ ga aza.

Ndị Gọvanọ a mekwara ka ndị mpaghara ahụ mata na “anyị nwegasịrị ndị nche ógbè na ndị nche ọhịa na steeti nile nọ na mpaghara a, ndị ha na ndị ọrụ nchekwa na-arụkọ ọrụ kwa iji chekwaba ndụ n’akụnụba n’obodo anyị dị iche iche.

“Mgbe oge ruru, anyị ga-akpọku Gọọmenti Etiti ka ha mata ihe banyere otu nchekwa a n’uju”

Na mmechi, ndị Gọvanọ a keke kwara ndị Imeobi Ọhaneze ndị bịara kpọtụrụ ha, ma kwekwaa ha nkwa itinye ndụmọdụ nile n’ọrụ maka ọdịmma nke Ndigbo.

Hmm, Ìgwè bụ ike. Ebe Ndigbo nile, ma ndị Gọvanọ, ma ndị Ọhaneze,  ma ndị ụkọchukwu kwetaworo, Ndigbo ga-enwe Amotekun nke ha n’oge n’adịghị anya.

O si taa dị mma, ọ dịrị gawa. Iseeee!

Leave a Reply

Your email address will not be published.