AMACHIELA ONYE OGBU BỌL TARA ONYE OCHE GOL ISI

Itali –  Otu na-elekọta egwuregwu bọl na mba Itali nọrọ ụbọchị Tuuzdee machie Antonio Martinnielo, onye ogbu bọl (referee) tara onye oche gol isi.

N’asọmmpi dị n’etiti otu egwu bọl Borgo Mogliano na Montottone n’abalị mbụ nke ọnwa Febrụwarị na Macerata, ogbu bọl ahụ ziri Matteo Ciccioli, oche gol ndị Borgo Mogliano, ndị a nọ be ha akwụkwọ nchụpụ( red card) ka ha na e meri 3-1.

Kaosiladi, onye oche gol ahụ bịara jụwa ya ihe mere o ji zi ya akwụkwọ nchụpụ ka a na abanyezi n’ụlọ nyipu akwa. Nke a meziri o ji taa Ciccioli isi e ji buga ya ụlọ ọgwụ.

Mmachi otu afọ a Martiniello nwetara ga-eme ka ọ ghara ịbata ebe ọbụla a na-eme asọmmpi bọl n’Itali n’oge ahụ.

Hmm, nsogbu dịkwa

Leave a Reply

Your email address will not be published.