ỌJỊ ỤZỌ-KALỤ JI AKA ABỤỌ ADỌBATA T. A. ỌJỊ NA NGA

Spread the love

Ụmụahịa –  Na Sinetọ T. A. Ọjị,  Ochendo onye na anọchiteanya Mpaghara Etiti Abịa na Sineti ma bụrụkwa onye si n’ọkwa rituo dịka Gọvanọ Abịa Steeti ga – eje nga ma a kpachaghị anya, maka ebubo EFCC na ebo ya izu akatamkpo ego ndị Abịa Steeti ruru ijeri Naira Narị iri ise n’iri abụọ n’ise (N525 billion) abụghịkwa akụkọ.

Ihe bụ akụkọ bụ na Sinetọ Ọjị Ụzọ-Kalụ, onye bụbu nna ya ukwu nakwa onye ọ nọchiri n’ọkwa dịka Gọvanọ Abịa Steeti bụ ya ji aka abụọ ado nwoke a bụ Ochendo, ka ọ dọbata ya na nga.

Kepu Kepu hoo!haa!! nwetara bụ na obi adịghị Sinetọ Ụzọ – Kalụ mma ebe Ochendo nọ maka o weere na ọ bụ Ochendo, onye nke o mere Gọvanọ ka ọ nọ n’ụlọ nga bụ ya “gbapuru ya afọ” site na inye ndị EFCC ihe akaebe e jiri tụọ ya bụ odogwu nga.

Ya bụ “nwa nnụnụ ọgba ama”, onye maara Sinetọ ahụ nọ na mkpọrọ were na anọchiteanya ndị Mpaghara Mgbago Ugwu Abia na Sineti na-ekwu na mmadụ abụọ aka ha dị na mmiri mara odogwu ahụ bụ Sinetọ Bola Tinubu na Ochendo T. A. Ọjị.

Nkea bụrụ eziokwu, marakwa na Ochendo agaghị ala ije a. N’Ejije ọ pụrụ iche “Living in Bondage”, Andy gwara Paulo na “Ọ bụrọ sọọsọ m ga-ata ahụhụ a”.

Ọzọkwa, nke Ochendo ga-aka njọ maka na nwa ya nwoke, Ikuku Rt. Hon. Chinedu Ọjị, Ọnụ na  e kwuru Ụlọ Nzukọ Omebeiwu Abia Steeti ugbua ma bụrụkwa onye na-akwadosi ike iweghara ọkwa ọchịchị dịka Gọvanọ ma Aka na-achị Abia ugbua bụ Dọkịnta Okezie Ikpeazụ rituo n’ọkwa n’afọ 2023 dịkwa n’okwu ahụ.

Ya bụ Ochendo na-eje nga, Ikuku omeka nna ya e buru akpa sochie ya azụ.

Hmm, ihe a bụkwa ịdọ aka na ntị nye Gọvanọ na-achị Abia Steeti ugbua tinyere ndị Gọvanọ Steeti ndị ọzọ dị n’Ala-Igbo.

Mmadụ agaghị akwụsịnwu ndị Gọvanọ na Naịjiriya izu ohi ego ọha. Mbanụ! Nke ahụ bụzị ịgwa ngwere ka ọ gbaa ajị.

Kaosiladi, ha na-ezu, ha ezukwala nke na-akọ ọkọ na ntị N525bn! E ji ya eme gịnị?

Ọzọkwa, ọ bụ arụ ma ndị gọvanọ ndị ọzọ ṅomie Gọvanọ Seyi Makinde nke Ọyọ Steeti, onye kemgbe ọ batara n’ọchịchị gosiri onwe ya dịka onye na-asọ izu ego ọha e nyere ya ka o jiri rụọ ọrụ nsọ?

Leave a Reply

Your email address will not be published.