VAL: ONYE “ARA” COSSY ỌJỊAKỌ NA-EMEPE ỤLỌ EGWU AWANTỊLỌ

Legọs – Onye ‘Ara’ Cossy Ọjịakọ na-akwado ibido ụlọ egwu awantịlọ na be ya na Legọs n’ụbọchị Satọdee, abalị iri n’ise nke ọnwa a iji merube mmemme ịhụnanya bụ ụbọchị ‘Valentine’.

Ọjịakọ, omebe ejije Nollywood nakwa ọgụ egwu bụ onye ama maka ibuputa nnukwu ara ya nke ọ sịrị bụ ‘onyinye Chi ya nyere ya’ n’ezi oge ọbụla.

Nwanyị a si Ọkịja, Anambara Steeti bụ “azụ anụ ụka” maka na ọ chọghị ịgbanwe ajọ ndụ ya n’agbanyeghị ihe ọnụ ụwa na-ekwu banyere ya.

N’oge gara aga, akụkọ maka ya nkịta inwe mmekọahụ gazuru ebe nile. A kọkwara akụkọ na o so emebe ejije mmekọahụ (porn).

N’afọ 2016, o kwuru okwu na o nwere onye chọrọ ịlụ ya mana o nweghị onye mazị etu okwu ahụ siri gaa.

Afọ gara aga, Cossy kwara arịrị na ndị otu ya na Nollywood gbaghapụrụ oge a wara ya ahụ n’ụlọ ọgwụ ka ọ gbajiri ụkwụ.

“Ego iji gaa ụlọ ọgwụ kọrọ m mana o nweghị ndị otu anyị na Nollywood gbatara m ọsọ enyemaka ma ya fọdụzịa ịbịa leta n’ụlọ ọgwụ mana nsogbu adịghị”

Cossy na ahazi njem ụgbọ mmiri mkpori ndụ ebe ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na-eji oringo egbu onwe ya.

Hmm, nwanyị a marakwa na e jighị ibi ajọ ndụ anya isi mere na   “ikwighikwii jiri nyụọ áhụ̀ sị ụmụ ya kụọrọ ya aka, ha a sị ya Tụfịakwa, na anaghị e kwere ihe ọjọọ egwu”

Leave a Reply

Your email address will not be published.