BOKO HARAM ABATAWO LEGỌS – BURATAI

Spread the love

Legọs – Ọchịagha Ukwu nke ndị agha Naịjiriya,  Lt. Gen. Tukur Buratai, ekwuola hoo!haa!! na ndị Boko Haram abatawo Legọs tinyekwara ebe ndị ọzọ nile na Naịjiriya.

N’okwu ya na Arise TV, Buratai kwuru na ndị oyiọhaegwu (terrorists) a ndị a chụpụrụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ugwu ala anyị kwagazịrị akụkụ ndị ọzọ na Naịjiriya

O kwuzịrị ihe gbara ọhaneze gharịị.

“Ndi agha emeriwo ndị Boko Haram mana nsogbu ndị oyiọhaegwu ka na-echere ha aka mgba”

Ọchịagha a kwukwara na nsogbu iyiọhaegwu (terrorism) ka ga anọte aka ná Naịjiriya.

“O nweghị ebe ndị Boko Haram anọghị- ma na Legọs ebea, ha nọ. Na Kaduna  Boko Haram nọ. E jidela ọtụtụ n’ime ha na Legọs”

N’agbanyeghị okwu Buratai ,Boko Haram na-akpazị ike dị egwu ugbua.

Ụnyahụ, ha wakporo ma gbukwaa ọtụtụ mmadụ na Jiddari-Polo, didebere Meiduguri, Boronu Steeti ozigbo Onyeisiala Muhammadu Buharị ka bịachara ha mgbaru maka ndị nwụrụ na mwakpo a wakporo Auno dịkwa na steeti ahụ.

Nsogbu dịkwa! Ya bụ na Boko Haram agbaala anyị gburugburu

Leave a Reply

Your email address will not be published.