GBAGHARANỤ, E MEFERE M IHE OKE-NNAMDỊ KANỤ

Spread the love

Maka Ịzọ mba igbu ụmụ kọmishọna ndị Uwe Ojii n’Abịa Steeti 

Ụmụahịa – Mazị Nnamdi Kehinde Kanụ, Onyeisi otu IPOB nọrọ na Twitter were rịọ m gbara maka ịzọ mba igbu ụmụ Kọmishọna ndị Uwe Ojii n’Abịa Steeti, Mazị Ene Okon, ma o nwere ihe mere onye IPOB ọbụla bịara akwamozu nne ya nna ya taa bụ abalị iri n’anọ nke ọnwa Febrụwarị, afọ 2020 n’Afaraukwu, Ibeku, Ụmụahịa, Abịa Steeti.

Kanụ kwuburu sị, “O nwere ihe mere onye IPOB ọbụla n’akwamozu nne na nna m, anyị ga achụta ma gbuo ụmụ Kọmishọna ndị Uwe Ojii, Ene Okon nakwa ụmụ Ọchịagha Ukwu ndị soja Naịjiriya, Tukur Buratai, tinyere ndị ọzọ ọbụla aka ha dị ya”

Onyeisi ndị IPOB meziri ihe tụrụ ndị mmadụ n’anya site na ikweta na ya mehiere

Ozi ya na Twitter kwuru sị, “Ụbọchị Fraịdee a, ndị na-eru uju na Bịafra ga agbakọta maka akwamozu nne na nna m m hụrụ n’anya, Eze Israel Okwu Kanu na Ugoeze Sally Nnenne Kanu.

” N’oge iru uju a, ndị Bịafra bizi oke ize ndụ. Kọmishọna ndị Uwe Ojii na-azọ mba ịtisa akwamozu a, ndị soja jupụtakwara ebe nile, ndị a ma maka ịla ndụ ndị #IPOB n’iyi.

” Nke a butere m oke nchekasị. E si m na oke mwute maka ọnwụ nne na nna m banye n’oke iwe n’ọnụma maka na oke ihe égwù dị banyere ndụ ndị na-abịa akwamozu a.

“N’oge iwe n’ọnụma a, a zọrọ m mba megide ụmụ Kọmishọna ndị Uwe Ojii nakwa ụmụ ndị ọrụ nchekwa Naịjiriya ndị ọzọ na Mmemme m na Rediyo Biafra.

“Nkea dị njọ, e jikwa m obi nile arịọ mgbaghara. E kwesịghị ịkpọnye ụmụaka mmadụ n’okwu a.

“Ebumnuche m bụ ime ka otu mba ụwa mata ihe na-achọ ime iji gbochie ịlakwa ndụ ndị nke m n’iyi.

“Mana, e mefere m ihe oke.

Hmm, taa bụkwa gboo. Onye mehie rịọ mgbaghara ,ụmụnna gbaghara ya ka udo chịa

Leave a Reply

Your email address will not be published.