NSOGBU ‘VAL’ : ‘CONDOM’ IRI N’ABỤỌ DỊ N’OBERE AKPA EGO FUNAHỤRỤ ONYE CORPER!

Owere – Otu nwokorọbịa onye corper, ji otu afọ efe ala nna ya ka ndị ezigbo mmadụ tụtara obere akpa ego(wallet) funahụrụ ya n’Owere, mepee ya iji mara ma ha a ga-ahụ akwụkwọ ejirimara ya.

Ihe ha hụrụ tụrụ ha n’anya: Okpu nna bụ enyi iri n’abụọ ya na N5 abụọ !

Bikonu, nwokorọbịa a na-agbazị akwụla? Okpu nna bụ enyi (condoms) 12! A na-agbazị ‘war’ ? Ime ‘val’ abụzị ịlụ agha?

Ọ kwa udiri ndị a na-anwụ n’ihu ọgụ. Mgbe otu onye chị CONDOM ka ọ bụ mgbọ egbe iri n’abụọ n’akpa na-akpagharị, gịnị mere na ọ gaghị anwụ ọgwụ? Ma o nweghị ego, ọ zụrụ tramadol were Alomo Bitters ṅụdaga ya.

Ikekwa corper a ahụbeghi ego iji rie nke bụ ezigbo nri.

Chai! Iberibe!

Aha corper ahụ bụ Ọladịpọ.

Hmm, unu ahụla ndị na-aza Ọla, zeerenu ha; ma Ọlaniyi, ma Ọladịpọ, ma Ọlanihu

Leave a Reply

Your email address will not be published.