CHAỊ! ỤMỤ NWANYỊ ISE EJIRILA IKO KWAGBUO DI HA N’IKE

Spread the love

Oturkpo – Otu ọgaranya lụrụ nwunye isii kubiri nwụọ ụnyahụ n’elu ọrụ ebe ndị nwunye manyere ya ma dinakwaa ya n’ike n’Ugbugbu dị n’Okpuru Ọchịchị Ogbadibo, Benuwe Steeti.

Mazị Uroko Onoja ka ya nwanyị ọhụrụ ya nke ikpeazụ na enwe mmekọahụ tupu ndị nwunye ya ise ndị ọzọ e jiri mma na mkpara wakpo ha abụọ ma sie ọnwụ na ọ ga-edinacha ha nile otu oge ahụ.

Nwoke a kwuru elu, kwuo ala ndị nwunye ya jụ, jụwaa isi na ọ ga “akpụ ha isi ọ kpụrụ Albert”

Mazị lịzịrị obi were banye n’ọrụ a a manyere ya amanye ịrụ.

Nwoke a kubiri ka nwanyị nke ise na-arịkwasa n’elu àkwà iwere ihe nke ya.

Kaọdịtaa, ndị Uwe Ojii ejidela mmadụ abụọ n’ime ụmụ nwanyị ndị ahụ jiri iko kwagbuo di ha.

Ọnọja nụchara mmanya were bata n’elekere atọ nke isi ụtụtụ were lakwuru nwunye ya nke ikpeazụ.

Ọ maghị na ndị nwunye ya ndị nje ọzọ, ndị na-enwere nwunye ya nke ọhụrụ ahụ anya ọkụ achịala izu ma chebiri ya na obi adịghị ha mma ka o si emezi ha “alụta agbọghọ, a chụpụ agadi”

Ozi hoo!haa!! nwetara na akọwa na nwoke a, onye ndị mmadụ mara dika omere ọha siri ole ike ya tupu ụmụ nwanyị ise ahụ ejituo ya n’ike.

Hmm, nsogbu dịkwa. Ụmụ nwoke  kedunu ihe mmadụ ji isi kote?

Leave a Reply

Your email address will not be published.