“ADEBOYE ABỤGHỊ EZIGBO ỤKỌCHUKWU, MAKA ỊGWA ỤMỤ NWOKE HA ANỤLA NWANYỊ AMAGHỊ ESI NRI” – ADA ỌNỤ

Spread the love

Legọs – Ọtụtụ mmadụ akatọọla okwu Ụkọchukwu Enọk Ade Adeboye, Onye Nlekọta Gburugburu, Ụlọ ụka Redeemed Christian Church of God (RCCG) maka ozi ya na Twitter ebe o kwuru sị, “Ụmụ m nwoke, unu anụla nwanyị amaghị esi nri. O kwesịrị ịma ịrụ ọrụ ụlọ nakwa isi nri maka na ị gaghị atọ na iri nri n’ezi oge nile.”

Ọzọkwa, o dere sị,” Ụmụ m nwoke, unu anụla nwa agbọghọ ọbụla bụ ‘onye ụwa’. Ma ọ bụghị ya, i butewo ihe ị ga-efezị ndụ gị nile”

Ọzọkwa, o dere sị, “Ụmụ m nwanyị, unu anụkwala nwoke n’enweghị ọrụ”

Otu onye na Twitter, Ada Ọnụ dere sị, “Nkea gosiri na Ụkọchukwu Enọk Adeboye abụghị ezigbo Ụkọchukwu

Otu onye a ma ama maka ikwuchutere ụmụ nwanyị ọnụ ha Toke Makinwa dere na Twitter sị, “Ndị Ụkọchukwu Adeboye na-agwa bụ  “ụmụ ya nwoke”. Ma i soghi n’ìgwè atụrụ ya, gbachite ya nkịtị”

O dekwara ọzọ na Twitter sị,” Isi nri abụghị sọọsọ maka ụmụ nwanyị. Ụmụ nwoke, mụtanụ isi nri, ka ịma esi nri hapụ ịbụ sọọsọ ihe ị ga-agbado ụkwụ maka ịchọ nwanyị ị ga-alụ”

Hmm, ịma esi nri dịkwa mkpa mana ọ bụghị ya kacha mkpa n’alum dị na nwunye. Ihe kacha mkpa bụ nghọta. Ndị na-abanye alụmdi na nwunye kwesịrị ịghọta ma nabata akwaramagwa onwe ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.