BOBRISKY NWERE ÍSÌ ỌJỌỌ N’AHỤ – JP BLUSH

Spread the love

Legọs –  Egbe ọnụ na-ada ugbua n’etiti Bobrisky na JP Blush, mmadụ abụọ ndị omekanwa nwanyị na-azọ onye mekarịrị ibe ya ka nwanyị.

J P Blush, onye ezigbo aha ya bụ Johntel Peters bụ omeka nwanyị na-ekwu na ọ ka Bobrisky mma.

O kwuru sị, “Bobrisky nwere nnukwu ísì ọjọọ n’ahụ. Ihe ndị Uwe Ojii ji kpụrụ ya bụ maka na ọ na-agwakọ ude nchawa ahụ Tiannah na hypo na-eresi ndị mmadụ”

N’egbughị oge, Bobrisky, onye nwekwuru ajọ ọnụ zaghachiri ya

“Lekwenu! Nkea kpọrọ nkụ ka o kpere(sugar cane) ndị Fulani. Mụ na gị enweghị okwu. Onye mụ na nwere okwu bụ nne gị – TOYIN LAWANNI. Nne gị akọghọrọ gị akụkọ ụwa ya? I ga-ebu nọrọ ala ka nne gị kọrọ gị maka mkpọkọrọ ndụ ya tupu ọ kọwara gị maka ndụ ndị ọzọ.

“Nke ikpeazụ nne gị gara nke ndị Uwe Ojii n’Abụja, a hapụrụ ya. Mana, ọ gaa nke ugbu a, ọ gaghị alọta. Ị kọọ m, m’ kọọ nne gị”

Biko, ihere adịzịkwa n’obodo a chaa chaa? Ikwighikwighi nyụrụ ahụ sị ụmụ ya ha kụọrọ ya aka, ha asị ya “Tụfịakwa!” na anaghị ekwere ihe ọjọọ egwu.

Taa, a na-ekweziri ihe ọjọọ egwu. Ụwa mmebi!

Leave a Reply

Your email address will not be published.