ỤKA AJỤWO ILI ONYE OTU HA JI ỤGWỌ “TITHE”

Spread the love

Otu ụlọ ụka akụrụmaka ajụwo ili onye otu ha maka na nwoke ahụ ji ụgwọ ego otu ụzọ n’ụzọ iri (tithe).

N’agbanyeghị nkatọ nile ndị mmadụ na-akatọ akparamagwa a, ụlọ ụka ahụ kpọrọ ekwo nkụ.

Ndị mmadụ sịrị na nkea gosiri na ihe ka ndị ụka mkpa bụ ịnapụta ndị otu ha ego, na ọ bụghị Ọdịmma ha.

Akụkọ a bụ otu nwoke Kelvin Odanz, wepụtara ya na Twitter. O kwuru na nwoke a ndị ụka ya jụrụ ili bụ onye ya na nna ya na arụ ọrụ n’otu ebe.

Ụlọ ụka ahụ kwukwara na ndị ezinụlọ nwoke ahụ laworo mmụọ ga akwụcha ụgwọ “tithe” nile o ji kemgbe afọ atọ tupu ha abịa lie ya.

N’akwụkwọ nsọ, ili onye nwụrụ anwụ so n’ọrụ obi ebere Jeso gụrụ ndị na-eso ụzọ ya gana arụ.

Kaosiladi, akwaramagwa a, ịda ndị dị ndụ nha tupu ndị ụka abịa lie onye nke ha laworo mmụọ abụghịkwa sọọsọ ndị ụka akụrụmaka na-akpa ya.

Ndị Katọliki na ndị Angịlịkan na-emekwa etu ahụ.

Tupu e lie onye ọbụla, ndị ụka  ma ọ bụ Katọliki ma ọ bụ Angịlịkan ga agụ ụgwọ nile onye ahụ laworo mmụọ ji. Ndị ezinụlọ ya ga-akwụ u ụgwọ nile o ji.

Mana, nke a e ziri ezi ?

2 Comments

  1. Coronavirus Fear Starts Six Day Inventory Reduction and Modification
    The 온카지노 virus, which has now spread to 47 countries, is pressing companies and supply chains around the world.




    0



    0
  2. Now, in less than a month, the 온카지노사이트 virus has killed at least 2,809 people, sickening a total of more than 82,600 people, and almost everything is certain to spread in the United States. This is no longer a question of whether this will happen, but exactly when it will happen,” Dr. Nancy Mesonier, director of the National Center for Immunity Respiratory Diseases, said in a briefing on Tuesday.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.